< Abụ Ọma 95 >

1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
請大家前來向上主歡呼,齊向救助我們的磐石歌舞。
2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.
一齊到祂面前感恩讚頌,向祂歌唱聖詩,歡呼吟詠。
3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.
因為上主是尊高的天主,是超越諸神的偉大聖主;
4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
大地深淵都在祂的手中,高山崚嶺都是祂的化工。
5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.
海洋屬於祂,因為是祂所創造;陸地屬於祂,因為是祂所形成。
6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
請大家前來叩首致敬,向造我們的上主跪拜。
7 nʼihi na ọ bụ Chineke anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
因為祂是我們的真神,我們是祂牧養的人民,是祂親手引導的羊群。您們今天該聽從祂的聲音:
8 “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
不要再像在默黎巴那樣心頑,也不要像在曠野中瑪撒那天!
9 ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
您們的祖先雖然見過我的工作,在那裏他們還是試探我,考驗我。
10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’
四十年之久,我厭惡了那一世代,曾說:這百姓心中迷惑,不肯承認我的真道,
11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’”
因此我懷著憤怒而起說:他們決不得進入我的的安所。

< Abụ Ọma 95 >