< Abụ Ọma 94 >

1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.
Yahwe, Ee Mungu ulipaye kisasi, Mungu ulipaye kisasi, utuangazie sisi.
2 Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.
Inuka, muhukumu wa nchi, uwape wenye majivuno kile wanachosahili.
3 Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?
Mpaka lini waovu, Yahwe, mpaka lini waovu watafurahia?
4 Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
Wanamwaga maneno yao ya kiburi; wote watendao uovu wanajivuna.
5 Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.
Wanawaangamiza watu wako, Yahwe; wanalitesa taifa ambao ni milki yako.
6 Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
Wanamuua mjane na mgeni aishiye nchini mwao, na wanamuua yatima.
7 Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”
Nao husema, “Yahwe hawezi kuona, Mungu wa Yakobo hayagundui haya.”
8 Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?
Tambueni, ninyi watu wajinga! Enyi wapumbavu, mtajifunza lini?
9 Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?
Yeye aliye liumba sikio, hasikii? Yeye aliye litengeneza jicho, haoni?
10 Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?
Yeye awaadhibuye mataifa, hayuko sahihi? Yeye ndiye ampaye maarifa mwanadamu.
11 Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.
Yahwe anayajua mawazo ya wanadamu, kuwa ni mvuke.
12 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;
Amebarikiwa yule ambaye umuongozaye, Yahwe, yule ambaye wewe humfundisha kutoka katika sheria yako.
13 ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.
Wewe humpa pumziko wakati wa shida mpaka shimo litakapokuwa limechimbwa kwa ajili ya waovu.
14 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.
Maana Yahwe hatawaacha watu wake wala kutelekeza warithi wake.
15 Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.
Kwa kuwa tena hukumu itakuwa ya haki; na wote walio wanyoofu wa moyo wataifuata.
16 Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?
Ni nani atainuka kunitetea dhidi ya watendao uovu? Ni nani atasimama dhidi ya waovu kwa ajili yangu?
17 A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
Kama Yahwe asingelikuwa msaada wangu, haraka ningekuwa nimelala mahali pa ukimya.
18 Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
Niliposema, mguu wangu unateleza,” Uaminifu wa agano lako, Yahwe, uliniinua.
19 Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.
Wasiwasi uwapo mwingi ndani yangu, faraja yako hunifurahisha.
20 A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?
Kiti cha uharibifu chaweza kushirikiana nawe, kitungacho madhara kwa njia ya sheria?
21 Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.
Wao kwa pamoja hupanga njama kuwaua wenye haki na kuwahukumu adhabu ya kifo wenye haki.
22 Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.
Lakini Yahwe amekuwa mnara wangu mrefu, na Mungu wangu amekuwa mwamba wa kimbilio langu.
23 Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.
Yeye atawarudishia uovu wao wenyewe na atawaangamiza katika uovu wao wenyewe. Yahwe Mungu wetu atawaangamiza.

< Abụ Ọma 94 >