< Abụ Ọma 94 >

1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.
あだを報いられる神、主よ、あだを報いられる神よ、光を放ってください。
2 Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.
地をさばかれる者よ、立って高ぶる者にその受くべき罰をお与えください。
3 Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?
主よ、悪しき者はいつまで、悪しき者はいつまで勝ち誇るでしょうか。
4 Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.
彼らは高慢な言葉を吐き散らし、すべて不義を行う者はみずから高ぶります。
5 Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị.
主よ、彼らはあなたの民を打ち砕き、あなたの嗣業を苦しめます。
6 Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna.
彼らはやもめと旅びとのいのちをうばい、みなしごを殺します。
7 Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”
彼らは言います、「主は見ない、ヤコブの神は悟らない」と。
8 Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?
民のうちの鈍き者よ、悟れ。愚かな者よ、いつ賢くなるだろうか。
9 Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?
耳を植えた者は聞くことをしないだろうか、目を造った者は見ることをしないだろうか。
10 Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?
もろもろの国民を懲らす者は罰することをしないだろうか、人を教える者は知識をもたないだろうか。
11 Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.
主は人の思いの、むなしいことを知られる。
12 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;
主よ、あなたによって懲らされる人、あなたのおきてを教えられる人はさいわいです。
13 ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.
あなたはその人を災の日からのがれさせ、悪しき者のために穴が掘られるまでその人に平安を与えられます。
14 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.
主はその民を捨てず、その嗣業を見捨てられないからです。
15 Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.
さばきは正義に帰り、すべて心の正しい者はそれに従うでしょう。
16 Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?
だれがわたしのために立ちあがって、悪しき者を責めるだろうか。だれがわたしのために立って、不義を行う者を責めるだろうか。
17 A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.
もしも主がわたしを助けられなかったならば、わが魂はとくに音なき所に住んだであろう。
18 Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.
しかし「わたしの足がすべる」と思ったとき、主よ、あなたのいつくしみはわたしをささえられました。
19 Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.
わたしのうちに思い煩いの満ちるとき、あなたの慰めはわが魂を喜ばせます。
20 A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?
定めをもって危害をたくらむ悪しき支配者はあなたと親しむことができるでしょうか。
21 Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.
彼らは相結んで正しい人の魂を責め、罪のない者に死を宣告します。
22 Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.
しかし主はわが高きやぐらとなり、わが神はわが避け所の岩となられました。
23 Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.
主は彼らの不義を彼らに報い、彼らをその悪のゆえに滅ぼされます。われらの神、主は彼らを滅ぼされます。

< Abụ Ọma 94 >