< Abụ Ọma 93 >

1 Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
Jehovha anobata ushe, akashongedzwa noumambo; Jehovha akashongedzwa noumambo uye akafukidzwa nesimba. Nyika yakateyiwa zvakasimba; haingazungunuswi.
2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
Chigaro chenyu choushe chakasimbiswa kare kare; imi muripo nokusingaperi.
3 Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
Haiwa Jehovha, makungwa akasimudza, makungwa akasimudza manzwi awo; makungwa akasimudza mafungu anotinhira.
4 Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
Mukuru kukunda kutinhira wemvura zhinji, mukuru kukunda mafungu egungwa, Jehovha ari kumusoro ndiye mukuru.
5 Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
Zvamakatema hazvishanduki; utsvene hunofukidza imba yenyu imi Jehovha, kwamazuva asingaperi.

< Abụ Ọma 93 >