< Abụ Ọma 93 >

1 Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
여호와께서 통치하시니 스스로 권위를 입으셨도다 여호와께서 능력을 입으시며 띠셨으므로 세계도 견고히 서서 요동치 아니하도다
2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị.
주의 보좌는 예로부터 견고히 섰으며 주는 영원부터 계셨나이다
3 Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ.
여호와여 큰 물이 소리를 높였고 큰 물이 그 소리를 높였고 큰 물이 그 물결을 높이나이다
4 Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.
높이 계신 여호와의 능력은 많은 물 소리와 바다의 큰 파도보다 위대하시니이다
5 Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.
여호와여 주의 증거하심이 확실하고 거룩함이 주의 집에 합당하여 영구하리이다

< Abụ Ọma 93 >