< Abụ Ọma 92 >

1 Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
“A psalm for the Sabbath-day.” It is a good thing to give thanks to the LORD, And to sing praises to thy name, O Most High!
2 ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
To show forth thy loving-kindness in the morning, And thy faithfulness every night,
3 jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.
Upon the ten-stringed instrument and the lute, Upon the harp with a solemn sound.
4 Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
For thou, LORD, hast made me glad by thy doings; In the works of thy hands I greatly rejoice!
5 Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
How great are thy works, O LORD! How deep thy purposes!
6 Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta,
But the unwise man knoweth not this, And the fool understandeth it not.
7 ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
When the wicked spring up like grass, And all who practise iniquity flourish, It is but to be destroyed for ever!
8 Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
Thou, O LORD! art for ever exalted!
9 Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
For, lo! thine enemies, O LORD! For, lo! thine enemies perish, And dispersed are all who do iniquity!
10 I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma.
But my horn thou exaltest like the buffalo's; I am anointed with fresh oil.
11 Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.
Mine eye hath gazed with joy upon mine enemies; Mine ears have heard with joy of my wicked adversaries.
12 Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
The righteous shall flourish like the palm-tree; They shall grow up like the cedars of Lebanon;
13 nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
Planted in the house of the LORD, They shall flourish in the courts of our God.
14 Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
Even in old age they bring forth fruit; They are green, and full of sap;
15 na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”
To show that the LORD, my rock, is upright, That there is no unrighteousness in him.

< Abụ Ọma 92 >