< Abụ Ọma 91 >

1 Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
He that dwelleth in the secret place of the most High shall abide under the shadow of the Almighty.
2 Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”
I will say of YHWH, He is my refuge and my fortress: my Elohim; in him will I trust.
3 Nʼezie, ọ ga-anapụta gị site nʼọnya nke onye osi ọnya na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
Surely he shall deliver thee from the snare of the fowler, and from the noisome pestilence.
4 Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị. Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ, ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
He shall cover thee with his feathers, and under his wings shalt thou trust: his truth shall be thy shield and buckler.
5 Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị, maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
Thou shalt not be afraid for the terror by night; nor for the arrow that flieth by day;
6 maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị, ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
Nor for the pestilence that walketh in darkness; nor for the destruction that wasteth at noonday.
7 Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị, iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị, ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
A thousand shall fall at thy side, and ten thousand at thy right hand; but it shall not come nigh thee.
8 Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.
Only with thine eyes shalt thou behold and see the reward of the wicked.
9 Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị, ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
Because thou hast made YHWH, which is my refuge, even the most High, thy habitation;
10 mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị; ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
There shall no evil befall thee, neither shall any plague come nigh thy dwelling.
11 Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.
For he shall give his angels charge over thee, to keep thee in all thy ways.
12 Ha ga-eji ọbụ aka ha, bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.
They shall bear thee up in their hands, lest thou dash thy foot against a stone.
13 Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ, zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.
Thou shalt tread upon the lion and adder: the young lion and the dragon shalt thou trample under feet.
14 “Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru; aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.
Because he hath set his love upon me, therefore will I deliver him: I will set him on high, because he hath known my name.
15 Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya. Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya, aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.
He shall call upon me, and I will answer him: I will be with him in trouble; I will deliver him, and honour him.
16 Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya, gosikwa ya nzọpụta m.”
With long life will I satisfy him, and shew him my salvation.

< Abụ Ọma 91 >