< Abụ Ọma 90 >

1 Ekpere Mosis, bụ onyeozi Chineke. O Onyenwe anyị, ebe obibi ka gị onwe gị bụrịị nye anyị nʼọgbọ niile.
神人摩西的祈祷。 主啊,你世世代代作我们的居所。
2 Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.
诸山未曾生出, 地与世界你未曾造成, 从亘古到永远,你是 神。
3 Ị na-eme ka mmadụ laghachi bụrụ aja mgbe i kwuru okwu sị, “Unu ụmụ mmadụ, laghachi bụrụ aja.”
你使人归于尘土,说: 你们世人要归回。
4 Puku afọ dị nʼanya gị dịka otu ụbọchị; ha dịka ụnyaahụ gafere agafe maọbụ ka otu awa nke anyasị.
在你看来,千年如已过的昨日, 又如夜间的一更。
5 Nʼime ụra nke ọnwụ ka ị na-ekpochapụ mmadụ; ha dịka ahịhịa ọhụrụ nke na-epupụta nʼisi ụtụtụ,
你叫他们如水冲去; 他们如睡一觉。 早晨,他们如生长的草,
6 ọ bụ ezie na ọ na-agbawa ụzarị na-etokwa eto nʼụtụtụ, ma nʼanyasị, ọ na-akpọnwụ ma-achanwụkwaa.
早晨发芽生长, 晚上割下枯干。
7 E meela ka anyị gwụsịa nʼihi oke iwe gị megide anyị; anyị na-amakwa jijiji nʼihi ọnụma gị.
我们因你的怒气而消灭, 因你的忿怒而惊惶。
8 Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.
你将我们的罪孽摆在你面前, 将我们的隐恶摆在你面光之中。
9 Ogologo ụbọchị anyị niile na-agabiga nʼoke iwe gị; afọ ndụ anyị nke fọdụrụ ka anyị na-ebi dịka okwu e ji nwayọọ kwuo na mwute.
我们经过的日子都在你震怒之下; 我们度尽的年岁好像一声叹息。
10 Ogologo ụbọchị anyị niile nwere ike ruo afọ iri asaa, maọbụ afọ iri asatọ, ma ọ bụrụ na ike anyị adịgide, ma otu ọ dị, nke a ga-asị na ọ bụ ya kachasị mma na-ejupụta na nsogbu na ịsụ ude, nʼihi na ha na-agabiga ọsịịsọ, anyị onwe anyị na-efelakwa.
我们一生的年日是七十岁, 若是强壮可到八十岁; 但其中所矜夸的不过是劳苦愁烦, 转眼成空,我们便如飞而去。
11 Onye pụrụ ịghọta ịdị ike nke oke iwe gị? Nʼihi na oke iwe gị dị ukwuu dịka ịtụ egwu kwesiri gị si dị ukwuu.
谁晓得你怒气的权势? 谁按着你该受的敬畏晓得你的忿怒呢?
12 Kuziere anyị ịgụ ụbọchị niile nke ndụ anyị ọnụ, ka anyị si otu a nweta obi amamihe jupụtara.
求你指教我们怎样数算自己的日子, 好叫我们得着智慧的心。
13 O Onyenwe anyị, nwee ntụgharị obi! Tutu ruo ole mgbe ka ọ ga-adị? Meere ndị ohu gị ebere.
耶和华啊,我们要等到几时呢? 求你转回,为你的仆人后悔。
14 Jiri ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide, mejupụta anyị nʼụtụtụ, ka anyị nwee ike ịbụ abụ ọṅụ ma nwekwaa obi ụtọ ogologo ụbọchị ndụ anyị niile.
求你使我们早早饱得你的慈爱, 好叫我们一生一世欢呼喜乐。
15 Mee ka anyị nwee obi ụtọ, nke ọnụọgụgụ ụbọchị ya ga-adịkwa ka ọnụọgụgụ ụbọchị niile ị tara anyị ahụhụ, ka ọnụọgụgụ afọ ya dịkwa ka ọnụọgụgụ afọ niile anyị hụrụla nsogbu.
求你照着你使我们受苦的日子, 和我们遭难的年岁,叫我们喜乐。
16 Kwere ka ndị ohu gị hụ ọrụ gị dị iche iche, ka ụmụ ha hụkwa ịma mma gị.
愿你的作为向你仆人显现; 愿你的荣耀向他们子孙显明。
17 Ka ihuọma Chineke, Onyenwe anyị dịkwasị anyị; mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike, e, mee ka ọrụ aka anyị guzosie ike.
愿主—我们 神的荣美归于我们身上。 愿你坚立我们手所做的工; 我们手所做的工,愿你坚立。

< Abụ Ọma 90 >