< Abụ Ọma 9 >
1 Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
To the Overseer, 'On the Death of Labben.' — A Psalm of David. I confess, O Jehovah, with all my heart, I recount all Thy wonders,
2 Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
I rejoice and exult in Thee, I praise Thy Name, O Most High.
3 Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
In mine enemies turning backward, they stumble and perish from Thy face.
4 I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
For Thou hast done my judgment and my right. Thou hast sat on a throne, A judge of righteousness.
5 I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
Thou hast rebuked nations, Thou hast destroyed the wicked, Their name Thou hast blotted out to the age and for ever.
6 Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
O thou Enemy, Finished have been destructions for ever, As to cities thou hast plucked up, Perished hath their memorial with them.
7 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
And Jehovah to the age abideth, He is preparing for judgment His throne.
8 Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
And He judgeth the world in righteousness, He judgeth the peoples in uprightness.
9 Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
And Jehovah is a tower for the bruised, A tower for times of adversity.
10 Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
They trust in Thee who do know Thy name, For Thou hast not forsaken Those seeking Thee, O Jehovah.
11 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
Sing ye praise to Jehovah, inhabiting Zion, Declare ye among the peoples His acts,
12 Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
For He who is seeking for blood Them hath remembered, He hath not forgotten the cry of the afflicted.
13 O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
Favour me, O Jehovah, See mine affliction by those hating me, Thou who liftest me up from the gates of death,
14 ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
So that I recount all Thy praise, In the gates of the daughter of Zion. I rejoice on Thy salvation.
15 Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
Sunk have nations in a pit they made, In a net that they hid hath their foot been captured.
16 Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. (Sela)
Jehovah hath been known, Judgment He hath done, By a work of his hands Hath the wicked been snared. (Meditation, Selah)
17 Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. (Sheol )
The wicked do turn back to Sheol, All nations forgetting God. (Sheol )
18 Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
For not for ever is the needy forgotten, The hope of the humble lost to the age.
19 O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
Rise, O Jehovah, let not man be strong, Let nations be judged before Thy face.
20 O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu; mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. (Sela)
Appoint, O Jehovah, a director to them, Let nations know they [are] men! (Selah)