< Abụ Ọma 88 >
1 Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra. O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.
Gospode Bože, spasitelju moj, danju vièem i noæu pred tobom.
2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m.
Nek izaðe preda te molitva moja, prigni uho svoje k jauku mojemu;
3 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. (Sheol )
Jer je duša moja puna jada, i život se moj primaèe paklu. (Sheol )
4 Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.
Izjednaèih se s onima koji u grob odlaze, postadoh kao èovjek bez sile,
5 A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.
Kao meðu mrtve baèen, kao ubijeni, koji leže u grobu, kojih se više ne sjeæaš, i koji su od ruke tvoje daleko.
6 Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.
Metnuo si me u jamu najdonju, u tamu, u bezdanu.
7 Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. (Sela)
Oteža mi gnjev tvoj, i svima valima svojim udaraš me.
8 Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;
Udaljio si od mene poznanike moje, njima si me omrazio; zatvoren sam, i ne mogu izaæi.
9 anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
Oko moje usahnu od jada, vièem te, Gospode, vas dan, pružam k tebi ruke svoje.
10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? (Sela)
Eda li æeš na mrtvima èiniti èudesa? ili æe mrtvi ustati i tebe slaviti?
11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
Eda li æe se u grobu pripovijedati milost tvoja, i istina tvoja u truhljenju?
12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?
Eda li æe u tami poznati èudesa tvoja, i pravdu tvoju gdje se sve zaboravlja?
13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.
Ali ja, Gospode, k tebi vièem, i jutrom molitva moja sreta te.
14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?
Zašto, Gospode, odbacuješ dušu moju, i odvraæaš lice svoje od mene?
15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.
Muèim se i izdišem od udaraca, podnosim strahote tvoje, bez nadanja sam.
16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.
Gnjev tvoj stiže me, strahote tvoje razdiru me.
17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.
Optjeèu me svaki dan kao voda, stežu me otsvuda.
18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.
Udaljio si od mene druga i prijatelja; poznanici moji sakrili su se u mrak.