< Abụ Ọma 86 >
1 Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
Sikia, Ee Yahwe, na unijibu, kwa kuwa ni maskini na mnyonge.
2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
Unilinde, maana mimi ni mwaminifu; Mungu wangu, umuokoe mtumishi wako anayekuamini.
3 meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.
Unihurumie, Bwana, maana ninakulilia wewe mchana kutwa.
4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
Umfurahishe mtumishi wako, maana ni kwako, Bwana, ninaomba.
5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
Wewe, Bwana, ni mwema, na uko tayari kusamehe, na huonesha huruma kubwa kwa wale wanao kulilia wewe.
6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
Yahwe, sikiliza maombi yangu; sikia sauti ya ombi langu.
7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.
Katika siku ya shida ninakuita wewe, kwa maana utanijibu.
8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.
Katikati ya miungu hakuna wa kufananishwa na wewe, Bwana. Hakuna matendo kama matendo yako.
9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.
Mataifa yote ambayo umeyafanya yatakuja kwako na kusujudu mbele zako, Bwana. nao wataliheshimu jina lako.
10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
Kwa kuwa wewe ni mkuu na utendaye mambo ya ajabu; wewe pekee ndiwe Mungu.
11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
Unifundishe njia zako, Yahwe. Kisha nitatembea katika kweli yako. Unifanye kukuheshimu wewe.
12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
Bwana Mungu wangu, nitakusifu kwa moyo wangu wote; nitalitukuza jina lako milele.
13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol )
Kwa maana uaminifu wa agano lako ni mkuu kwangu; wewe umeokoa uhai wangu kutoka chini kuzimuni. (Sheol )
14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
Ee Mungu, wenye kiburi wameinuka dhidi yangu. Kundi la watu wenye vurugu wanautafuta uhai wangu. Nao hawakuheshimu wewe.
15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Lakini wewe, Bwana, ni mwenye huruma na neema, hukasiliki haraka, na mwingi katika uaminifu wa agano lako na kweli.
16 Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
Unigeukie na unihurumie; mpe nguvu zako mtumishi wako; umuokoe mwana wa mjakazi wako.
17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
Unioneshe ishara ya fadhila zako. Kisha wale wanichukiao wataziona na kuaibishwa kwa sababu yako; Yahwe, umenisaidia na kunifariji.