< Abụ Ọma 85 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora. O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.
“For the leader of the music. A psalm of the sons of Korah.” O LORD! thou hast been favorable to thy land; Thou hast brought back the captives of Jacob;
2 I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. (Sela)
Thou didst forgive the iniquity of thy people, And cover all their sins! (Pause)
3 Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
Thou didst take away all thy displeasure, And abate the fierceness of thy wrath.
4 Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.
Restore us, O God of our salvation! And let thine anger towards us cease!
5 Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?
Wilt thou be angry with us for ever? Wilt thou continue thy wrath from generation to generation?
6 Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?
Wilt thou not revive us again, That thy people may rejoice in thee?
7 O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị.
Show us thy compassion, O LORD! And grant us thy salvation!
8 Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.
I will hear what God the LORD will speak: Truly he will speak peace to his people, and to his servants; Only let them not turn again to folly!
9 Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
Yea, his salvation is near to those who fear him, That glory may dwell in our land.
10 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ.
Mercy and truth shall meet together, Righteousness and peace shall kiss each other;
11 Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.
Truth shall spring out of the earth; Righteousness shall look down from heaven.
12 Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.
Yea, Jehovah will give prosperity, And our land shall yield her increase.
13 Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.
Righteousness shall go before him, And set us in the way of his steps.

< Abụ Ọma 85 >