< Abụ Ọma 84 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!
Fún adarí orin. Gẹ́gẹ́ bí ti gittiti. Ti àwọn ọmọ Kora. Saamu. Ibùgbé rẹ̀ ti lẹ́wà tó, Olúwa àwọn ọmọ-ogun!
2 Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ.
Ọkàn mi ń ṣàfẹ́rí nítòótọ́ ó tilẹ̀ pòǹgbẹ fún àgbàlá Olúwa àyà mi àti ara mi ń kọrin ayọ̀ sí Ọlọ́run alààyè.
3 Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
Nítòótọ́ ológoṣẹ́ ri ilé, ẹyẹ alápáǹdẹ̀dẹ̀ tẹ́ ìtẹ́ fún ara rẹ̀, níbi tí yóò máa pa ọmọ rẹ̀ mọ́ sí: ibùgbé ní tòsí pẹpẹ rẹ̀, Olúwa àwọn ọmọ-ogun, ọba mí àti Ọlọ́run mi.
4 Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. (Sela)
Ìbùkún ní fún àwọn tí ó ń gbé inú ilé rẹ; wọn ó máa yìn ọ́ títí láé.
5 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
Ìbùkún ni fún àwọn tí agbára wọn wà nínú rẹ àwọn tí wọ́n gbé ọkàn lé bíbẹ ibi mímọ́ wò.
6 Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.
Àwọn tí ń la àfonífojì omijé lọ wọn sọ ọ́ di kànga àkọ́rọ̀ òjò sì fi ìbùkún bò ó.
7 Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.
Wọ́n ń lọ láti ipa dé ipá títí tí ọ̀kọ̀ọ̀kan fi farahàn níwájú Ọlọ́run ní Sioni.
8 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.
Gbọ́ àdúrà mi, Olúwa Ọlọ́run Alágbára; tẹ́tí sí mi, Ọlọ́run Jakọbu.
9 Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.
Wo asà wa, Ọlọ́run; fi ojú àánú wò àwọn ẹni àmì òróró rẹ.
10 Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
Dídára ní ọjọ́ kan ní ààfin rẹ ju ẹgbẹ̀rún ọjọ́ lọ; èmi o kúkú máa ṣe aṣọ́nà nínú ilé Ọlọ́run mi jù láti gbé ní àgọ́ àwọn ènìyàn búburú.
11 Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.
Nítorí Olúwa Ọlọ́run jẹ́ òòrùn àti asà; Olúwa fún ni ní ojúrere àti ọlá; kò sí ohun rere kan tí yóò fàsẹ́yìn fún àwọn tí ó rìn ní àìlábùkù.
12 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
Olúwa àwọn ọmọ-ogun, ìbùkún ni fún ọkùnrin náà tí ó gbẹ́kẹ̀lé ọ.

< Abụ Ọma 84 >