< Abụ Ọma 84 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!
Müzik şefi için - Gittit üzerine - Korahoğulları'nın mezmuru Ey Her Şeye Egemen RAB, Ne kadar severim konutunu!
2 Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ.
Canım senin avlularını özlüyor, İçim çekiyor, Yüreğim, bütün varlığım Sana, yaşayan Tanrı'ya sevinçle haykırıyor.
3 Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
Kuşlar bile bir yuva, Kırlangıç, yavrularını koyacak bir yer buldu Senin sunaklarının yanında, Ey Her Şeye Egemen RAB, Kralım ve Tanrım!
4 Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. (Sela)
Ne mutlu senin evinde oturanlara, Seni sürekli överler! (Sela)
5 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
Ne mutlu gücünü senden alan insana! Aklı hep Siyon'u ziyaret etmekte.
6 Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.
Baka Vadisi'nden geçerken, Pınar başına çevirirler orayı, İlk yağmurlar orayı berekete boğar.
7 Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.
Gittikçe güçlenir, Siyon'da Tanrı'nın huzuruna çıkarlar.
8 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.
Ya RAB, Her Şeye Egemen Tanrı, duamı dinle, Kulak ver, ey Yakup'un Tanrısı! (Sela)
9 Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.
Ey Tanrı, kalkanımıza bak, Meshettiğin krala lütfet!
10 Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
Senin avlularında bir gün, Başka yerdeki bin günden iyidir; Kötülerin çadırında yaşamaktansa, Tanrım'ın evinin eşiğinde durmayı yeğlerim.
11 Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.
Çünkü RAB Tanrı bir güneş, bir kalkandır. Lütuf ve yücelik sağlar; Dürüstçe yaşayanlardan hiçbir iyiliği esirgemez.
12 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.
Ey Her Şeye Egemen RAB, Ne mutlu sana güvenen insana!

< Abụ Ọma 84 >