< Abụ Ọma 83 >

1 Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
Waƙa ce. Zabura ta Asaf. Ya Allah, kada ka yi shiru; kada ka tsaya cik, ya Allah, kada ka daina motsi.
2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
Dubi yadda abokan gābanka suke fariya, dubi yadda maƙiyanka suke ɗaga kansu.
3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
Da wayo suna ƙulle-ƙulle a kan mutanenka; suna shirya maƙarƙashiya a kan waɗanda kake so.
4 Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
Suna cewa, “Ku zo, bari mu hallaka su ɗungum a matsayin al’umma, don kada a ƙara tuna da sunan Isra’ila.”
5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
Da zuciya ɗaya suka yi ƙulle-ƙulle tare; suka haɗa kai gāba da kai,
6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
tentunan Edom da na mutanen Ishmayel, na Mowab da kuma na Hagirawa,
7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
Gebal, Ammon da Amalek, Filistiya, tare da mutanen Taya.
8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. (Sela)
Har Assuriya ma ta haɗa kai da su don ta ba da ƙarfi ga zuriyar Lot. (Sela)
9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
Ka yi musu abin da ka yi wa Midiyan, yadda ka yi wa Sisera da Yabin a kogin Kishon,
10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
waɗanda suka hallaka a En Dor suka zama kamar juji a ƙasa.
11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
Ka mai da manyansu kamar Oreb da Zeyib, dukan sarakunansu kamar Zeba da Zalmunna,
12 ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
waɗanda suka ce, “Bari mu mallaki wuraren kiwon Allah.”
13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
Ka mai da su kamar ɗan tsiron da kan karye, iska ta yi ta turawa, ya Allahna, kamar yayin da iska take hurawa,
14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
kamar yadda wuta ke cin kurmi ko harshen wutar da take ci a kan duwatsu,
15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
haka za ka kore su da iska mai ƙarfi ka kuma firgita su da guguwarka.
16 Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.
Ka rushe fuskokinsu da kunya don mutane su nemi sunanka, ya Ubangiji.
17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
Bari su kasance cikin kunya da taƙaici; bari su hallaka cikin wulaƙanci.
18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
Bari su san cewa kai, wanda sunansa ne Ubangiji, cewa kai kaɗai ne Mafi Ɗaukaka a bisa dukan duniya.

< Abụ Ọma 83 >