< Abụ Ọma 83 >
1 Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
A Song; a Psalm of Asaph. O God, keep not silence; hold not thy peace, and be not still, O God:
2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
For behold, thine enemies make a tumult; and they that hate thee lift up the head.
3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
They take crafty counsel against thy people, and consult against thy hidden ones:
4 Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
They say, Come, and let us cut them off from being a nation, and let the name of Israel be mentioned no more.
5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
For they have consulted together with one heart: they have made an alliance together against thee.
6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
The tents of Edom and the Ishmaelites, Moab and the Hagarites;
7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
Gebal, and Ammon, and Amalek; Philistia, with the inhabitants of Tyre;
8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. (Sela)
Asshur also is joined with them: they are an arm to the sons of Lot. (Selah)
9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
Do unto them as to Midian; as to Sisera, as to Jabin, at the torrent of Kishon:
10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
Who were destroyed at Endor; they became as dung for the ground.
11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
Make their nobles as Oreb and as Zeeb; and all their chiefs as Zebah and as Zalmunna.
12 ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
For they have said, Let us take to ourselves God's dwelling-places in possession.
13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
O my God, make them like a whirling thing, like stubble before the wind.
14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
As fire burneth a forest, and as the flame setteth the mountains on fire,
15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
So pursue them with thy tempest, and terrify them with thy whirlwind.
16 Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.
Fill their faces with shame, that they may seek thy name, O Jehovah.
17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
Let them be put to shame and be dismayed for ever, and let them be confounded and perish:
18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
That they may know that thou alone, whose name is Jehovah, art the Most High over all the earth.