< Abụ Ọma 82 >

1 Abụ Ọma Asaf. Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
Zaburi ya Asafu. Mungu anaongoza kusanyiko kuu, anatoa hukumu miongoni mwa “miungu”:
2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? (Sela)
“Hata lini utaendelea kuwatetea wasio haki na kuonyesha upendeleo kwa waovu?
3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
Teteeni wanyonge na yatima, tunzeni haki za maskini na walioonewa.
4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
Mwokoeni mnyonge na mhitaji, wakomboeni kutoka mkononi mwa mwovu.
5 Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
“Hawajui lolote, hawaelewi lolote. Wanatembea gizani; misingi yote ya dunia imetikisika.
6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
“Nilisema, ‘Ninyi ni “miungu”; ninyi nyote ni wana wa Aliye Juu Sana.’
7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
Lakini mtakufa kama wanadamu wa kawaida; mtaanguka kama mtawala mwingine yeyote.”
8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.
Ee Mungu, inuka uihukumu nchi, kwa kuwa mataifa yote ni urithi wako.

< Abụ Ọma 82 >