< Abụ Ọma 82 >
1 Abụ Ọma Asaf. Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.
A Psalm of Asaph. God presides in the divine assembly; He renders judgment among the gods:
2 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? (Sela)
“How long will you judge unjustly and show partiality to the wicked?
3 Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.
Defend the cause of the weak and fatherless; uphold the rights of the afflicted and oppressed.
4 Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.
Rescue the weak and needy; save them from the hand of the wicked.
5 Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.
They do not know or understand; they wander in the darkness; all the foundations of the earth are shaken.
6 “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’
I have said, ‘You are gods; you are all sons of the Most High.’
7 Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”
But like mortals you will die, and like rulers you will fall.”
8 O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.
Arise, O God, judge the earth, for all the nations are Your inheritance.