< Abụ Ọma 81 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit. Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie Chineke Jekọb mkpu ike!
Nkunga Asafi kuidi pfumu minyimbidi; kayimbidila mu ngitala yi basi Ngati. Yimbidilanu Nzambi mu khini; niandi zingolo zieto! Yamikinanu kuidi Nzambi yi Yakobi!
2 Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une.
Tonanu miziki, sikanu zindungu; Bulanu minningu mu Ngitala ayi lu Lila.
3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;
Sikanu phoka yi dimemi va ntotukila ngondi yi mona; ayi Ngondi bu yidi yiduka ayi mu lumbu ki nyengo eto!
4 nke a bụ iwu dịrị Izrel, ụkpụrụ Chineke nke Jekọb.
Yayi yidi nzengolo mu diambu di Iseli, ayi tsikudukusu yi Nzambi yi Yakobi,
5 O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị:
Wukindisa yawu banga nsiku mu diambu di Zozefi mu thangu kanuanisa tsi yi Ezipite… Kuna tuwa mbembo yoyi tusia sudika ko.
6 “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ.
Tubidi: “Ndibotudi mfuna wubedi va mavangiti mawu. Ayi babotudi pani kibedi mu mioko miandi.
7 Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke Meriba. (Sela)
Mu ziphasi ziaku, ngeyo wutela ayi ndikula ndivana mvutu ku tsi dumu ki matuti nditota ku minlangu mi Meliba.
8 “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel!
Wanu beno batu bama, ayi ndiela kululubula: enati beno luzola ku ndimba, a Iseli.
9 Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ.
Kulendi ba kadi nzambi yi nzenza ko va khatitsikꞌaku. Kulendi buongimina nzambi yi nzenza ko!
10 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya.
Minu ndidi Yave, Nzambi, yoyi yilutotula mu tsi Ezipite; zibula bumboti munu aku ayi ndiela ku wuwesa.
11 “Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha.
Vayi batu bama basia zola ku ndimba ko; Iseli kasia kuthumukina ko.
12 Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha.
Buna ndiba yekula mu mintima miawu mingolo; mu landakana zikhanu ziawu veka.
13 “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile.
Enati batu bama bandima kuama, enati Iseli wuzola landakana zinzila ziama!
14 Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile.
Nganu mu nsualu ndieka tumbu kuba yekudila bambeni ziawu ayi balula koko kuama kuidi bobo beti kuba lenda.
15 Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi.
Bobo beti lenda Yave balenda kukikulula va ntualꞌandi ayi nganu thumbudulu awu yela zingilanga mu zithangu zioso;
16 Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
Vayi nganu ngeyo wudikulu mu ble yilutidi kitoko, mu niosi yintotukila mu ditadi, ndiela kuyukutisila.”

< Abụ Ọma 81 >