< Abụ Ọma 8 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
For the leader: A psalm of David, to be accompanied by a stringed instrument. Lord our God! How glorious in all the earth is your name! Your praise reaches as high as the heavens,
2 Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ.
from the mouths of children and infants. You have built a fortress against your enemies, to silence the foe and the rebel.
3 Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,
When I look at your heavens, the work of your fingers, the moon and the stars, which you have set there,
4 gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?
what are mortals, that you think of them, humans, that you visit them?
5 I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.
Yet you made them little less than divine, crowned them with glory and majesty,
6 I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.
made them lord of the works of your hands, put all things under their feet –
7 Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile,
sheep and oxen, all of them; and the wild beasts also:
8 na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.
birds of the air, and fish of the sea, and all that crosses the paths of the ocean.
9 O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
Lord our God! How glorious in all the earth is your name!