< Abụ Ọma 79 >
1 Abụ Ọma Asaf. O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Salimo la Asafu. Inu Mulungu, anthu a mitundu ina alowerera mʼcholowa chanu; ayipitsa Nyumba yanu yoyera, asandutsa Yerusalemu kukhala bwinja.
2 Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.
Iwo anapereka mitembo ya atumiki anu kwa mbalame zamlengalenga ngati chakudya, matupi a oyera mtima anu kwa zirombo za dziko lapansi.
3 Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke Jerusalem, ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.
Akhetsa magazi monga madzi kuzungulira Yerusalemu yense, ndipo palibe wina woti ayike mʼmanda anthu akufa.
4 Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.
Ife ndife chinthu chonyozeka kwa anansi athu, choseketsa ndi cholalatiridwa kwa iwo amene atizungulira.
5 O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?
Mpaka liti Inu Yehova? Kodi mudzakwiya mpaka muyaya? Kodi mpaka liti nsanje yanu idzayaka ngati moto?
6 Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka Chineke oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị;
Khuthulirani ukali wanu pa anthu a mitundu ina amene sakudziwani Inu, pa maufumu amene sayitana pa dzina lanu;
7 nʼihi na ha eripịala Jekọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.
pakuti iwo ameza Yakobo ndi kuwononga dziko lawo.
8 Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.
Musatilange chifukwa cha machimo a makolo athu chifundo chanu chibwere msanga kukumana nafe, pakuti tili ndi chosowa chachikulu.
9 Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.
Tithandizeni Inu Mulungu Mpulumutsi wathu, chifukwa cha ulemerero wa dzina lanu; tipulumutseni ndi kutikhululukira machimo athu chifukwa cha dzina lanu.
10 Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.
Chifukwa chiyani anthu a mitundu ina akuti, “Ali kuti Mulungu wawo?” Ife tikuona, zidziwike pakati pa anthu a mitundu ina kuti mumabwezera chilango chifukwa cha magazi amene anakhetsedwa a atumiki anu.
11 Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.
Kubuwula kwa anthu a mʼndende kufike pamaso panu; ndi mphamvu ya dzanja lanu muwasunge amene aweruzidwa kuti aphedwe.
12 Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.
Mubwezere kwa anansi athu kasanu nʼkawiri kunyoza kumene ananyoza Inu Ambuye.
13 Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Pamenepo ife anthu anu, nkhosa za pabusa panu, tidzakutamandani kwamuyaya, kuchokera mʼbado ndi mʼbado tidzafotokoza za matamando anu.