< Abụ Ọma 78 >

1 Abụ maskil nke Asaf. Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
A maskil of Asaph. My people, attend to my teaching: bend your ears to the words of my mouth,
2 Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
as I open my mouth in a poem on the riddling story of the past.
3 ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
What we have heard and known, and what our ancestors have told us,
4 Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
we will not hide from their children. We will tell to the next generation the praises and might of the Lord, and the wonders that he has done.
5 O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
He set up a testimony in Jacob, a law he appointed in Israel, which he commanded our ancestors to make known to their children,
6 ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
that the next generation should know it, that the children yet to be born should arise and tell their children;
7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
that in God they might put their confidence, and not forget God’s works; but that they might keep his commandments,
8 Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
and not be like their ancestors, a generation defiant and stubborn, a generation with heart unsteady, and spirit unfaithful towards God.
9 Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
Ephraimites, armed bowmen, turned back in the day of battle.
10 Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
They did not keep God’s covenant, they refused to walk in his law.
11 Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
They forgot what he had done, and the wonders he had shown them.
12 Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
He did wonders before their ancestors in the country of Zoan in Egypt.
13 O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
Through the sea which he split he brought them, making waters stand up like a heap;
14 O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
he led them by day with a cloud, all the night with a light of fire.
15 Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
From the rocks which he split in the wilderness, he gave them to drink as of ocean’s abundance.
16 O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
He brought streams out of the rock, and made water run down like rivers.
17 Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
Yet they still went on sinning against him, they defied the Most High in the desert.
18 Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
They willfully challenged God, demanding the food that they longed for.
19 Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
“Is God able,” such was their challenge, “to spread in the desert a table?
20 Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
From the rock that he struck there gushed water, and torrents that overflowed; but can he also give bread, or provide his people with meat?”
21 Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
When the Lord heard this, he was furious, and fire was kindled on Jacob, anger flared up against Israel.
22 Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
For they put no trust in God, no confidence in his help.
23 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
So he summoned the clouds above; and, opening the doors of heaven,
24 O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
he rained manna upon them for food, and grain of heaven he gave them.
25 Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
Everyone ate the bread of angels; he sent them food to the full.
26 O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
He launched the east wind in the heavens, and guided the south by his power.
27 O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
He rained meat upon them like dust, winged bird like the sand of the sea.
28 O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
In the midst of their camp he dropped it, all around their tents.
29 Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
They ate and were more than filled; he had brought them the thing they desired.
30 Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
But the thing they desired became loathsome: while their food was still in their mouths,
31 mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
the wrath of God rose against them. He slew the stoutest among them, and laid low the young men of Israel.
32 Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
Yet for all this they sinned yet more, and refused to believe in his wonders.
33 O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
So he ended their days in a breath, and their years in sudden dismay.
34 Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
When he slew them, then they sought after him, they turned and sought God with diligence.
35 Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
They remembered that God was their rock, and the Most High God their redeemer.
36 Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.
But they flattered him with their mouth, and lied to him with their tongue.
37 Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
Their heart was not steady with him, they were faithless to his covenant.
38 Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
But he is full of pity: he pardons sin and destroys not. Often he turns his anger away, without stirring his wrath at all.
39 Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
So he remembered that they were but flesh, breath that passes and does not return.
40 Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
But how often they rebelled in the desert, and caused him grief in the wilderness,
41 Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
tempting God again and again, provoking the Holy One of Israel.
42 Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
They did not remember his strength, nor the day he redeemed from the foe,
43 nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
how he set his signs in Egypt, in the country of Zoan his wonders.
44 O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
He turned their canals into blood, their streams undrinkable.
45 O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
He sent forth flies, which devoured them; frogs, too, which destroyed them.
46 O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
Their crops he gave to the caterpillar, and the fruits of their toil to the locust.
47 O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
He slew their vines with hail, and their sycamore trees with frost.
48 O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
He delivered their cattle to the hail, and their flocks to bolts of fire.
49 O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
He let loose his hot anger among them, fury and wrath and distress, a band of destroying angels.
50 O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
He cleared a path for his anger, did not spare them from death, but gave them over to pestilence.
51 O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
He struck down all the firstborn in Egypt, the first fruits of their strength in the tents of Ham.
52 Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
He led forth his people like sheep, he was guide to his flock in the desert.
53 O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
Securely he led them, and free from fear, while their foes were drowned in the sea.
54 Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
To his holy realm he brought them, to the mountain his right hand had purchased.
55 Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
He drove out the nations before them, and allotted their land for possession, and their tents for Israel to live in.
56 Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.
Yet they tempted and angered the Most High God, they did not observe his decrees.
57 Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
They drew back, false like their ancestors; they failed like a treacherous bow.
58 Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
Their shrines stirred him to anger, their idols moved him to jealousy.
59 Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
When God heard of this, he was furious, and he spurned Israel utterly.
60 Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
He abandoned his home in Shiloh, the tent he had pitched among people.
61 O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
He gave his strength up to captivity, his glory to the hands of the foe.
62 O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
He gave his people to the sword, he was furious with his own.
63 Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;
Fire devoured their young men, and their maidens had no marriage-song.
64 E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.
Their priests fell by the sword, and their widows could not weep.
65 Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.
Then the Lord awoke as from sleep, like a warrior flushed with wine;
66 Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
and he beat back his foes, putting them to perpetual scorn.
67 Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
He disowned the tent of Joseph, he rejected the tribe of Ephraim;
68 ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.
but he chose the tribe of Judah, Mount Zion, which he loves.
69 O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
And he built like the heights his sanctuary, like the earth which he founded forever.
70 Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;
And he chose David his servant, taking him from the sheepfolds.
71 o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.
From the mother-ewes he brought him, to be shepherd to Jacob his people, and to Israel his inheritance.
72 Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.
With upright heart did he shepherd them, and with skilful hands did he guide them.

< Abụ Ọma 78 >