< Abụ Ọma 77 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Don Yedutun. Na Asaf. Zabura ce. Na yi kuka ga Allah don taimako; na yi kuka ga Allah don yă ji ni.
2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
Sa’ad da nake cikin damuwa, na nemi Ubangiji; da dare na miƙa hannuwa ba gajiya raina kuma ya ƙi yă ta’azantu.
3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. (Sela)
Na tuna da kai, ya Allah, na kuma yi nishi; na yi nishi, ƙarfina kuwa duk ya raunana. (Sela)
4 I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
ka hana idanuna rufewa; na damu ƙwarai har ba na iya magana.
5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.
Na yi tunani kwanakin da suka wuce, shekarun da suka wuce da daɗewa;
6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
na tuna da waƙoƙina da dare. Zuciyata ta yi nishi, ƙarfina kuwa ya nemi yă sani.
7 “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
“Ubangiji zai ƙi ne har abada? Ba zai taɓa nuna alherinsa kuma ba?
8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
Ƙaunarsa marar ƙarewa ta ɓace ke nan har abada? Alkawarinsa ya kāsa ke nan a dukan lokaci?
9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” (Sela)
Allah ya manta yă yi jinƙai? Cikin fushinsa ya janye tausayinsa ne?” (Sela)
10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
Sai na yi tunani, “Zan yi roƙo saboda wannan, shekarun da Mafi Ɗaukaka ya miƙa hannunsa na dama.”
11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
Zan tuna da ayyukan Ubangiji; I, zan tuna mu’ujizanka na tun dā.
12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
Zan yi tunani a kan dukan ayyukanka in lura da dukan manyan abubuwan da ka aikata.
13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
Hanyoyinka, ya Allah, masu tsarki ne. Wanda allah ne yake da girma kamar Allahnmu?
14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
Kai ne Allahn da yakan aikata mu’ujizai; ka nuna ikonka a cikin mutane.
15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. (Sela)
Da hannunka mai ƙarfi ka fanshi mutanenka, zuriyar Yaƙub da Yusuf. (Sela)
16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ.
Ruwaye sun gan ka, ya Allah, ruwaye sun gan ka suka firgita; zurfafan gaske sun girgiza.
17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.
Gizagizai sun sauko da ruwa, sararin sama suka buga tsawa; kibiyoyinka suka yi ta kai komo da walƙiya.
18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
Aka ji tsawanka a cikin guguwa, walƙiyarka ta haskaka duniya; duniya ta yi rawar jiki ta girgiza.
19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
Hanyarka ta bi ta cikin teku, hanyarka ta bi cikin manyan ruwaye, duk da haka ba a ga sawunka ba.
20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.
Ka bi da mutanenka kamar garke ta hannun Musa da Haruna.

< Abụ Ọma 77 >