< Abụ Ọma 77 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
I cried to God with my voice, even to God with my voice; and he gave ear to me.
2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
In the day of my trouble I sought the Lord: my sore ran in the night, and ceased not: my soul refused to be comforted.
3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. (Sela)
I remembered God, and was troubled: I complained, and my spirit was overwhelmed. (Selah)
4 I kweghị ka anya m abụọ mechie; nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
You hold my eyes waking: I am so troubled that I cannot speak.
5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, na afọ niile ndị gara aga.
I have considered the days of old, the years of ancient times.
6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
I call to remembrance my song in the night: I commune with my own heart: and my spirit made diligent search.
7 “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
Will the Lord cast off for ever? and will he be favorable no more?
8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
Is his mercy clean gone for ever? does his promise fail for ever more?
9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” (Sela)
Has God forgotten to be gracious? has he in anger shut up his tender mercies? (Selah)
10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
And I said, This is my infirmity: but I will remember the years of the right hand of the most High.
11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
I will remember the works of the LORD: surely I will remember your wonders of old.
12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
I will meditate also of all your work, and talk of your doings.
13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
Your way, O God, is in the sanctuary: who is so great a God as our God?
14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
You are the God that do wonders: you have declared your strength among the people.
15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. (Sela)
You have with your arm redeemed your people, the sons of Jacob and Joseph. (Selah)
16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke, osimiri hụrụ gị, taa; ogbu mmiri mere mkpọtụ.
The waters saw you, O God, the waters saw you; they were afraid: the depths also were troubled.
17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri, mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; àkụ gị gburu amụma ebe niile.
The clouds poured out water: the skies sent out a sound: your arrows also went abroad.
18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, amụma gị nyere ụwa niile ihe; elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
The voice of your thunder was in the heaven: the lightning lightened the world: the earth trembled and shook.
19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
Your way is in the sea, and your path in the great waters, and your footsteps are not known.
20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn duo ndị gị dịka igwe atụrụ.
You led your people like a flock by the hand of Moses and Aaron.

< Abụ Ọma 77 >