< Abụ Ọma 76 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
Kwa mwimbishaji. Kwa ala za nyuzi za muziki. Zaburi ya Asafu. Wimbo. Katika Yuda, Mungu anajulikana, jina lake ni kuu katika Israeli.
2 Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn
Hema lake liko Salemu, makao yake katika Sayuni.
3 Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. (Sela)
Huko alivunja mishale imetametayo, ngao na panga, silaha za vita.
4 Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
Wewe unangʼaa kwa mwanga, mwenye fahari zaidi ya milima yenye utajiri wa wanyama pori.
5 A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
Mashujaa hulala wametekwa nyara, hulala usingizi wao wa mwisho; hakuna hata mmoja wa watu wa vita anayeweza kuinua mikono yake.
6 Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.
Kwa kukemea kwako, Ee Mungu wa Yakobo, farasi na gari la vita vilikaa kimya.
7 Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
Wewe peke yako ndiye wa kuogopwa. Ni nani awezaye kusimama mbele yako unapokasirika?
8 I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
Kutoka mbinguni ulitamka hukumu, nayo nchi ikaogopa, ikawa kimya:
9 mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. (Sela)
wakati wewe, Ee Mungu, ulipoinuka kuhukumu, kuwaokoa wote walioonewa katika nchi.
10 Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
Hakika ghadhabu yako dhidi ya wanadamu inakuletea sifa, na masalia ya ghadhabu yako unajifunga mshipi.
11 Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
Wekeni nadhiri kwa Bwana Mungu wenu na kuzitimiza; nchi zote za jirani na walete zawadi kwa Yule astahiliye kuogopwa.
12 Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.
Huvunja roho za watawala; anaogopwa na wafalme wa dunia.