< Abụ Ọma 75 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
Fún adarí orin. Tí ohùn, “Má ṣe parun.” Saamu ti Asafu. Orin. A fi ìyìn fún ọ, Ọlọ́run, a yìn ọ́, nítorí orúkọ rẹ súnmọ́ tòsí; àwọn ènìyàn ń sọ ti ìyanu rẹ.
2 Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
Ìwọ wí pé, “Mo yan àkókò ìyàsọ́tọ̀; Èmi ni ẹni tí ń ṣe ìdájọ́ òdodo.
3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. (Sela)
Nígbà tí ayé àti àwọn ènìyàn ibẹ̀ wárìrì, Èmi ni mo di òpó rẹ̀ mú ṣinṣin.
4 Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
Èmí wí fún àwọn agbéraga pé, ẹ má ṣe gbéraga mọ́; àti sí ènìyàn búburú; ẹ má ṣe gbé ìwo yín sókè.
5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’”
Ẹ má ṣe gbe ìwo yín sókè sí ọ̀run; ẹ má ṣe sọ̀rọ̀ pẹ̀lú ọrùn líle.”
6 Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
Nítorí ìgbéga kò ti ìlà-oòrùn wá tàbí ní ìwọ̀-oòrùn, bẹ́ẹ̀ ni kì í ṣe láti gúúsù wá.
7 Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
Ṣùgbọ́n Ọlọ́run ni olùdájọ́; Ó ń rẹ ẹnìkan sílẹ̀, ó sì ń gbé ẹlòmíràn ga.
8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
Ní ọwọ́ Olúwa ni ago kan wà, ọtí wáìnì náà sì pọ́n, ó kún fún àdàlú, ó fún ọtí àdàlú tí a pò mọ́ òórùn dídùn tí ó tú jáde, àwọn ènìyàn búburú ayé gbogbo mú u pátápátá.
9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
Ṣùgbọ́n èmi, ó máa ròyìn rẹ títí láé; èmi ó kọrin ìyìn sí Ọlọ́run Jakọbu.
10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
Èmi ó gé ìwo gbogbo ènìyàn búburú, ṣùgbọ́n ìwo àwọn olódodo ni a ó gbéga.

< Abụ Ọma 75 >