< Abụ Ọma 75 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. Anyị na-eto gị, O Chineke. Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.
For the leader; al tashheth. A psalm of Asaph, a song. We praise you, God, we praise you: we would call on your name and declare your wonders.
2 Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.
‘At the time I choose, I will judge fairly.
3 Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. (Sela)
Though earth melt and all her inhabitants, it is I who keep steady her pillars.’ (Selah)
4 Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.
I say to the boasters, ‘Boast not’; to the wicked, ‘Lift not up your horn:
5 Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’”
lift not your horn on high, speak not boldly against the Rock.’
6 Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.
For not from east nor west, not from desert nor mountains;
7 Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.
but God himself is the judge, humbling one and exalting another.
8 Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.
In the hand of the Lord is a cup foaming wine, richly spiced. Out of this he pours a draught, and all the wicked of earth must drain it down to the dregs.
9 Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,
But I will rejoice forever, singing praise to the God of Jacob.
10 bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
I will hew all the horns of the wicked, but the horns of the just shall be lifted.

< Abụ Ọma 75 >