< Abụ Ọma 74 >
1 Abụ maskil nke Asaf. Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
阿撒夫的訓誨詩。 天主,您為何常久棄捨不管,對您牧場的羊群怒火炎炎?
2 Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
求您懷念您自古所佔有的會伴,您所贖回給您作產業的族團,及您在那裏設置寶座的熙雍山,
3 Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
求您舉步踏向久存的荒野:敵人在聖所中摧毀了一切。
4 Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
您的仇人在您的會場上咆哮狂謾,豎立起自己的旗幟作為凱旋紀念。
5 Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
他們相似高舉斧子的樵夫,在森林中砍伐堅硬的樹木。
6 Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
他們竟用斧頭鐵鎚,搗毀了聖殿的門扉;
7 Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
他們又縱火焚燒了您的聖殿,把您聖名的居所褻瀆於地面。
8 Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
心裏說:我們把它們全部摧毀,燒盡天主在地上所有的殿宇。
9 Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
我們的標幟,已再不見,一個先知也不復出現,我們都不知幾時纔完。
10 O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
天主,仇人欺凌辱罵要到何時﹖敵人豈能永遠褻瀆您的名字?
11 Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
為何您把您的手收回,將您的右手插入懷裏?
12 Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
天主,從古以來是我的君主,是他在人世間實行了救助。
13 Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
您以您的權能分開了大海,在水中擊破了毒龍的頭蓋。
14 Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
打碎了里外雅堂的頭顱,且將牠作為海怪的食物。
15 Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
您引源泉溪水流滾涓涓,卻使洶湧江河涸竭枯乾,
16 Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
白日屬於您,黑夜也屬於您,月亮和太陽都是由您佈置。
17 Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
您劃出了大地的界限,您制定了冬夏的時間。
18 O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
上主求您切記:仇人褻瀆了您,無知的百姓侮辱了您的名字。
19 Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
求您不要將您斑鳩的性命交給野鷹,永遠也不要忘記您的窮苦人的性命。
20 Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
求您回顧您所立的誓盟,因各地暗處充滿了強橫。
21 Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
願受壓迫的人不要含羞回程,願貧苦窮乏的人歌頌您的名。
22 O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
天主,求您速來處理您的案件,切記糊塗人天天對您的侮慢。
23 Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.
千萬不要忘了您敵人的喧囂,和反抗您的人們不斷的狂叫。