< Abụ Ọma 73 >
1 Abụ Ọma Asaf. Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
Zabura ta Asaf. Tabbatacce Allah mai alheri ne ga Isra’ila, ga waɗanda suke masu tsabta a zuciya.
2 Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
Amma game da ni, ƙafafuna suna gab da yin santsi; tafin ƙafana ya yi kusan zamewa.
3 Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
Gama na yi kishin masu girman kai sa’ad da na ga cin gaban da masu mugunta suke yi.
4 Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
Ba sa yin wata fama; jikunansu lafiya suke da kuma ƙarfi.
5 Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
Ba sa shan wata wahalar da sauran mutane ke sha; ba su da damuwa irin na’yan adam.
6 Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
Saboda girman kai ya zama musu abin wuya; tā da hankali ya zama musu riga.
7 Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
Daga mugayen zukatansu laifi kan fito mugaye ƙulle-ƙullen da suke cikin zukatansu ba su da iyaka.
8 Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
Suna ba’a, suna faɗin mugayen abubuwa; cikin girman kan suna barazana yin danniya.
9 Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
Bakunansu na cewa sama na su ne, kuma harsunansu sun mallaki duniya.
10 Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
Saboda haka mutanensu sun juya gare su suna kuma shan ruwa a yalwace.
11 Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
Suna cewa, “Yaya Allah zai sani? Mafi Ɗaukaka yana da sani ne?”
12 Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
Ga yadda mugaye suke, kullum ba su da damuwa, arzikinsu yana ta ƙaruwa.
13 Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
Tabbatacce a banza na bar zuciyata da tsabta; a banza na wanke hannuwa don nuna rashin laifi.
14 Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
Dukan yini na sha annoba; an hukunta ni kowace safiya.
15 Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
Da na ce, “Zan faɗa haka,” da na bashe’ya’yanka.
16 Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
Sa’ad da na yi ƙoƙari in gane wannan, sai ya zama danniya a gare ni
17 tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
sai da na shiga wuri mai tsarki na Allah; sa’an nan na gane abin da ƙarshensu zai zama.
18 Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
Tabbatacce ka sa su a ƙasa mai santsi; ka jefar da su ga hallaka.
19 Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
Duba yadda suka hallaka farat ɗaya, razana ta share su gaba ɗaya!
20 Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
Kamar yadda mafarki yake sa’ad da mutum ya farka, haka yake sa’ad da ka farka, ya Ubangiji, za ka rena su kamar almarai.
21 Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
Sa’ad da zuciyata ta ɓaci hankalina kuma ya tashi,
22 Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
na zama marar azanci da jahili; na zama kamar dabba a gabanka.
23 Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
Duk da haka kullum ina tare da kai; ka riƙe ni a hannun damana.
24 Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
Ka bishe ni da shawararka, bayan haka kuma za ka kai ni cikin ɗaukaka.
25 Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
Wa nake da shi a sama in ba kai ba? Ba na kuma sha’awar kome a duniya in ban da kai.
26 Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
Jikina da zuciyata za su iya raunana, amma Allah ne ƙarfin zuciyata da kuma rabona har abada.
27 Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
Waɗanda suke nesa da kai za su hallaka; kakan hallaka dukan waɗanda suke maka rashin aminci.
28 Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
Amma game da ni, yana da kyau in kasance kusa da Allah. Na mai da Ubangiji Mai Iko Duka mafakata; zan yi shelar dukan ayyukanka.