< Abụ Ọma 73 >

1 Abụ Ọma Asaf. Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
BOOK III A Psalm of Asaph. Surely God is good to Israel, even to such as are pure in heart.
2 Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
But as for me, my feet were almost gone; my steps had well nigh slipped.
3 Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.
For I was envious at the arrogant, when I saw the prosperity of the wicked.
4 Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
For there are no pangs at their death, and their body is sound.
5 Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
In the trouble of man they are not; neither are they plagued like men.
6 Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
Therefore pride is as a chain about their neck; violence covereth them as a garment.
7 Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
Their eyes stand forth from fatness; they are gone beyond the imaginations of their heart.
8 Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
They scoff, and in wickedness utter oppression; they speak as if there were none on high.
9 Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
They have set their mouth against the heavens, and their tongue walketh through the earth.
10 Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
Therefore His people return hither; and waters of fullness are drained out by them.
11 Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
And they say: 'How doth God know? And is there knowledge in the Most High?'
12 Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
Behold, such are the wicked; and they that are always at ease increase riches.
13 Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
Surely in vain have I cleansed my heart, and washed my hands in innocency;
14 Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
For all the day have I been plagued, and my chastisement came every morning.
15 Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
If I had said: 'I will speak thus', behold, I had been faithless to the generation of Thy children.
16 Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
And when I pondered how I might know this, it was wearisome in mine eyes;
17 tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
Until I entered into the sanctuary of God, and considered their end.
18 Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
Surely Thou settest them in slippery places; Thou hurlest them down to utter ruin.
19 Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
How are they become a desolation in a moment! They are wholly consumed by terrors.
20 Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
As a dream when one awaketh, so, O Lord, when Thou arousest Thyself, Thou wilt despise their semblance.
21 Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.
For my heart was in a ferment, and I was pricked in my reins.
22 Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
But I was brutish, and ignorant; I was as a beast before Thee.
23 Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.
Nevertheless I am continually with Thee; Thou holdest my right hand.
24 Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
Thou wilt guide me with Thy counsel, and afterward receive me with glory.
25 Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
Whom have I in heaven but Thee? And beside Thee I desire none upon earth.
26 Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
My flesh and my heart faileth; but God is the rock of my heart and my portion for ever.
27 Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
For, lo, they that go far from Thee shall perish; Thou dost destroy all them that go astray from Thee.
28 Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
But as for me, the nearness of God is my good; I have made the Lord GOD my refuge, that I may tell of all Thy works.

< Abụ Ọma 73 >