< Abụ Ọma 71 >

1 Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.
Mwa Inu Yehova ine ndathawiramo; musalole kuti ndichititsidwe manyazi.
2 Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.
Mundilanditse ndi kundipulumutsa mwa chilungamo chanu, mutchere khutu lanu ndi kundipulumutsa.
3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
Mukhale thanthwe langa lothawirapo, kumene ine nditha kupita nthawi zonse; lamulani kuti ndipulumuke, pakuti Inu ndinu thanthwe langa ndi linga langa.
4 O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
Landitseni Inu Mulungu wanga, kuchoka mʼdzanja la oyipa, kuchoka mʼdzanja la oyipa ndi anthu ankhanza.
5 Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.
Pakuti Inu mwakhala chiyembekezo changa, Inu Ambuye Wamphamvuzonse, chilimbikitso changa kuyambira ndili mwana.
6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
Kuyambira pamene ndinabadwa, ndakhala ndikudalira Inu; Inu munanditulutsa mʼmimba mwa amayi anga, ndipo ndidzakupembedzani nthawi zonse.
7 Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
Ine ndakhala chinthu chodabwitsa kwa anthu ambiri koma Inu ndinu wonditchinjiriza wamphamvu.
8 Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
Pakamwa panga padzaza ndi matamando anu, kulengeza ulemerero wanu tsiku lonse.
9 Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.
Musanditaye pamene ndakalamba; musandisiye pamene mphamvu zanga zatha.
10 Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.
Pakuti adani anga ayankhula motsutsana nane; iwo amene amadikira kuti andiphe amapangana pamodzi.
11 Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”
Iwo amati, “Mulungu wamusiya; mutsatireni ndi kumugwira, pakuti palibe amene adzamupulumutse.”
12 O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.
Musakhale kutali ndi ine Inu Mulungu, bwerani msanga, Inu Mulungu wanga; thandizeni.
13 Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
Ondineneza anga awonongeke mwa manyazi, iwo amene akufuna kundipweteka avale chitonzo ndi manyazi.
14 Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
Koma ine ndidzakhala ndi chiyembekezo mwa Inu nthawi zonse, ndidzakutamandani mowirikizawirikiza.
15 Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
Pakamwa panga padzafotokoza za chilungamo chanu, za chipulumutso chanu tsiku lonse, ngakhale sindikudziwa muyeso wake.
16 Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
Ndidzabwera ndi kulengeza za machitidwe amphamvu zanu Inu Ambuye Wamphamvuzonse. Ndidzalengeza chilungamo chanu, chanu chokha.
17 O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
Kuyambira ubwana wanga, Inu Mulungu mwakhala mukundiphunzitsa, ndipo mpaka lero ine ndikulengeza za ntchito zanu zodabwitsa
18 O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
Ngakhale pamene ndakalamba ndipo imvi zili mbuu musanditaye Inu Mulungu, mpaka nditalengeza mphamvu zanu kwa mibado yonse yakutsogolo.
19 O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
Mphamvu zanu ndi kulungama kwanu zimafika mpaka kumwambamwamba. Ndani wofanana nanu Inu Mulungu, amene mwachita zazikulu?
20 Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
Ngakhale mwandionetsa mavuto ambiri owawa, mudzabwezeretsanso moyo wanga; kuchokera kunsi kwa dziko lapansi, mudzandiukitsanso.
21 Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
Inu mudzachulukitsa ulemu wanga ndi kunditonthozanso.
22 O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel.
Ndidzakutamandani ndi zeze chifukwa cha kukhulupirika kwanu Mulungu, ndidzayimba matamando kwa Inu ndi pangwe, Inu Woyera wa Israeli.
23 Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
Milomo yanga idzafuwula ndi chimwemwe pamene ndidzayimba matamando kwa Inu amene mwandiwombola.
24 Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.
Lilime langa lidzafotokoza za ntchito zanu zachilungamo tsiku lonse, pakuti iwo amene amafuna kundipweteka achititsidwa manyazi ndi kusokonezedwa.

< Abụ Ọma 71 >