< Abụ Ọma 70 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
Kumqondisi wokuhlabela. ElikaDavida. Isikhalazo. Phangisa, Oh Nkulunkulu, ungisindise; Oh Thixo, woza masinyane uzongisiza.
2 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
Sengathi labo abafuna impilo yami bangayangiswa basanganiswe; sengathi bonke abafisa ukuwa kwami bangabuyiselwa emuva beyangekile.
3 Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
Sengathi labo abathi kimi, “Ehe! Ehe!” bangafulathela ngenxa yehlazo labo.
4 Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
Kodwa akuthi bonke abakudingayo bathokoze bajabule kuwe; akuthi labo abathanda insindiso yakho bahlale besithi, “uThixo kadunyiswe!”
5 Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.
Ikanti ngingumyanga ngiyaswela; woza masinyane kimi, Oh Nkulunkulu. Ulusizo lwami lomkhululi wami; Oh Thixo, ungaphuzi.

< Abụ Ọma 70 >