< Abụ Ọma 7 >

1 Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
Ṣiggaioni ti Dafidi, èyí tí ó kọ sí Olúwa nípa Kuṣi, ará Benjamini. Olúwa Ọlọ́run mi, ààbò mi wà nínú rẹ; gba mí là kí o sì tú mi sílẹ̀ lọ́wọ́ àwọn tó ń lé mi,
2 ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
kí wọn ó má ba à fa ọkàn mi ya gẹ́gẹ́ bí kìnnìún, wọ́n á ya á pẹ́rẹpẹ̀rẹ láìsí ẹni tí yóò gbà mí.
3 O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
Olúwa Ọlọ́run mi, tí èmi bá ṣe èyí tí ẹ̀bi sì wà ní ọwọ́ mi.
4 Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
bí èmi bá ṣe ibi sí ẹni tí ń wá àlàáfíà pẹ̀lú mi, tí mo ja ọ̀tá mi lólè láìnídìí,
5 Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. (Sela)
nígbà náà, jẹ́ kí ọ̀tá mi lé mi kí wọn sì mú mi; jẹ́ kí òun kí ó tẹ ọkàn mi mọ́lẹ̀ kí wọn sì mú mi sùn nínú eruku. (Sela)
6 Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
Dìde, Olúwa, nínú ìbínú rẹ; dìde lòdì sí ìrunú àwọn ọ̀tá mi. Jí, Ọlọ́run mi; kéde òdodo.
7 Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
Kí ìpéjọ àwọn ènìyàn yíká. Jọba lórí wọn láti òkè wá.
8 Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
Jẹ́ kí Olúwa ṣe ìdájọ́ àwọn ènìyàn. Ṣe ìdájọ́ mi, Olúwa, gẹ́gẹ́ bí òdodo mi, gẹ́gẹ́ bí ìwà òtítọ́, ẹni gíga jùlọ.
9 O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
Ọlọ́run Olódodo, Ẹni tí ó ń wo inú àti ọkàn, tí ó ń mú òpin sí ìwà ipá ẹni búburú tí ó sì ń pa àwọn olódodo mọ́.
10 Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
Ààbò mi ń bẹ lọ́dọ̀ Ọlọ́run, ẹni tí ń ṣe ìgbàlà òtítọ́ ní àyà.
11 Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
Ọlọ́run ni onídàájọ́ òtítọ́, Ọlọ́run tí ń sọ ìrunú rẹ̀ ní gbogbo ọjọ́.
12 Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
Bí kò bá yípadà, Òun yóò pọ́n idà rẹ̀ mú; ó ti fa ọrun rẹ̀ le ná, ó ti múra rẹ̀ sílẹ̀.
13 Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
Ó ti pèsè ohun ìjà ikú sílẹ̀; ó ti pèsè ọfà iná sílẹ̀.
14 Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
Ẹni tí ó lóyún ohun búburú, tí ó sì lóyún wàhálà, ó bí èké jáde.
15 Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.
Ẹni tí ó gbẹ́ ọ̀fìn, tí ó kó o jáde jì sí kòtò tí ó gbẹ́ sílẹ̀.
16 Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
Wàhálà tí ó fà padà sórí rẹ̀; ìwà ipá rẹ̀ padà sórí ara rẹ̀.
17 Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
Èmi ó fi ọpẹ́ fún Olúwa nítorí òdodo rẹ̀, èmi ó kọrin ìyìn sí Olúwa Ọ̀gá-ògo jùlọ.

< Abụ Ọma 7 >