< Abụ Ọma 7 >

1 Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
A Shiggaion of David, which he sang to the LORD concerning the words of Cush, a Benjamite. O LORD my God, I take refuge in You; save me and deliver me from all my pursuers,
2 ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
or they will shred my soul like a lion and tear me to pieces with no one to rescue me.
3 O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
O LORD my God, if I have done this, if injustice is on my hands,
4 Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
if I have rewarded my ally with evil, if I have plundered my foe without cause,
5 Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. (Sela)
then may my enemy pursue me and overtake me; may he trample me to the ground and leave my honor in the dust.
6 Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
Arise, O LORD, in Your anger; rise up against the fury of my enemies. Awake, my God, and ordain judgment.
7 Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
Let the assembled peoples gather around You; take Your seat over them on high.
8 Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
The LORD judges the peoples; vindicate me, O LORD, according to my righteousness and integrity.
9 O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
Put an end to the evil of the wicked, but establish the righteous, O righteous God who searches hearts and minds.
10 Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
My shield is with God, who saves the upright in heart.
11 Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
God is a righteous judge and a God who feels indignation each day.
12 Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
If one does not repent, God will sharpen His sword; He has bent and strung His bow.
13 Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
He has prepared His deadly weapons; He ordains His arrows with fire.
14 Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
Behold, the wicked man travails with evil; he conceives trouble and births falsehood.
15 Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.
He has dug a hole and hollowed it out; he has fallen into a pit of his own making.
16 Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
His trouble recoils on himself, and his violence falls on his own head.
17 Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
I will thank the LORD for His righteousness and sing praise to the name of the LORD Most High.

< Abụ Ọma 7 >