< Abụ Ọma 69 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Eji olu abụ “Okoko Lili.” Abụ Devid. O Chineke, zọpụta m, nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.
Uniokoe, Mungu; maana maji yameweka uhai wangu hatarini.
2 Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi, e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị. Abịala m nʼebe mmiri dị omimi; uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.
Ninazama kwenye kina cha matope, pasipo na hahari pa kusimama; nimekuja kwenye kina kirefu cha maji, ambako mafuriko yananifunika.
3 Akpịrị akpọọla m nkụ; ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka. Anya m agbaala ọchịchịrị ebe m na-ele anya Chineke.
Nimechoka sana kwa kulia kwangu; koo langu ni kavu; macho yangu yanafifia wakati namngoja Mungu wangu.
4 Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuu karịa agịrị isi dị m nʼisi. Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu, bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha. Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachi ihe m na-ezughị nʼohi.
Wale wanichukiao bila sababu wako zaidi ya nywele za kichwa changu; wale ambao wangeweza kuniua, wakiwa adui zangu kwa sababu zisizo sahihi, ni wengi mno; wanalazimisha nirudishe kile ambacho sijaiba.
5 Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile; ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.
Mungu, wewe unaujua ujinga wangu, na dhambi zangu hazifichiki kwako.
6 Ekwela ka ihere mee ndị na-atụkwasị gị obi nʼihi m, O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; ka ndị na-achọ gị ghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m, O Chineke nke Izrel.
Usiwaache wale wanao kungoja wewe waaibishwe kwa sababu yangu, Bwana Yahwe wa majeshi; usiwaache wale wanaokutafuta wewe wadharauliwe kwa sababu yangu, Mungu wa Israeli.
7 Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo, ihere ekpuchiela m ihu.
Kwa ajili yako nimestahimili lawama; aibu imeufunika uso wangu.
8 Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ, nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.
Nimekuwa mgeni kwa ndugu zangu, nisiye fahamika wala kuaminika kwa watoto wa mama yangu.
9 Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.
Kwa maana bidii ya nyumba yako imenila, na laumu zao wanao kulaumu wewe zimeniangukia mimi.
10 Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.
Wakati nilipolia na kutokula chakula, walinitukana.
11 Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.
Nilipoteneneza mavazi ya gunia, nikawa kituko kwao.
12 Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.
Wale wakaao katika lango la mji huniseng'enya; mimi ni wimbo wa walevi.
13 O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.
Lakini kwangu mimi, maombi yangu ni kwako, Yahwe, wakati ambao wewe utayapokea; unijibu katika uaminifu wa wokovu wako.
14 Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi.
Unitoe matopeni, na usiniache nizame; uniondoe mbali na wale wanaonichukia na uniokoe katika kina cha maji.
15 Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.
Usiache mafuliko ya maji yanielemee, wala kina kisinimeze. Usiache mdomo wa shimo unimeze.
16 O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.
Unijibu, Yahwe, maana uaminifu wa agano lako ni mwema; kwa maana rehema zako kwangu ni nyingi, unigeukie.
17 Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!
Usiufiche uso wako mbali na mtumishi wako, maana niko katika dhiki; unijibu haraka.
18 Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.
Uje kwangu na unikomboe. Kwa sababu ya adui zangu, uwe fidia yangu.
19 Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere: ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.
Wewe wajua kulaumiwa kwangu, kuaibishwa kwangu, na kudharauliwa kwangu; wapinzani wangu wote wako mbele yako.
20 Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi, ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka. Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ; lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.
Lawama imevunja moyo wangu; nimejawa na huzuni kubwa; nilitafuta mtu wa kunihurumia, lakini hakuwepo; nilitafuta wafariji, lakini sikupata.
21 Ha tinyere oluilu nʼime nri m, nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.
Walinipa sumu kwa ajili ya chakula changu; katika kiu yangu walinipa siki ninywe.
22 Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya; ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.
Meza yao mbele yao na iwe mtego; wafikiripo wako kwenye usalama, iwe kitanzi.
23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ, mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.
Macho yao na yatiwe giza ili kwamba wasiweze kuona; uvifanye viuno vyao kutetemeka daima.
24 Wụkwasị ha oke iwe gị, ka iwe gị dị ọkụ zute ha.
Wamwagie gadhabu yako, ukali wa hasira yako uwafikie wao.
25 Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.
Sehemu yao na iwe ukiwa; mtu yeyote asiishi katika hema yao.
26 Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ, na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.
Kwa kuwa walimtesa yule uliyempa adhabu. Mara kwa mara walihesabu maumivu ya wale walioumizwa.
27 Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume, ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.
Wakiwashtaki kuwa wamefanya uovu juu ya uovu; usiwaache waje kwenye ushindi wa haki yako.
28 Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ, ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.
Uwafute kwenye Kitabu cha Uzima na wasiandikwe pamoja na wenyehaki.
29 Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu, O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.
Lakini mimi ni maskini na mwenye huzuni; uruhusu wokovu wako, Mungu, uniweke juu sana.
30 Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke, jirikwa ekele bulie ya elu.
Nitalisifu jina la Mungu kwa wimbo na nitamtukuza yeye kwa shukrani.
31 Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi, karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.
Nitamsifu Yahwe zaidi kuliko ng'ombe au ndama aliye na mapembe na kwato.
32 Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ; unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.
Wanyenyekevu wameona na kufurahi; ninyi mnao matafuta Mungu, mioyo yenu itiwe nguvu.
33 Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa, ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.
Maana Yahwe husikia wenye uhitaji naye hawadharau wafungwa wake.
34 Ka eluigwe na ụwa too ya, osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.
Mbingu na nchi zimsifu yeye, bahari na vyote vitembeavyo majini.
35 Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn; ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.
Kwa maana Mungu ataiokoa Sayuni na ataujenga tena mji wa Yuda; watu wataishi huko na kupata umiliki wao.
36 Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya, ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.
Ukoo wa watumishi wake watairithi; nao walipendao jina lake wataishi humo.