< Abụ Ọma 68 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya bụrụ ndị a chụsasịrị; ka ndị iro ya site nʼihu ya gbalaga.
“To the chief musician, by David, a Psalm or song.” Oh that God would arise, that his enemies might be scattered, and those that hate him might flee before him.
2 Dịka ikuku si achụsa anwụrụ ọkụ, sikwa otu a chụsaa ha. Dịka mmanụ na-ehi ụra si agbaze nʼọkụ, ka ndị na-eme ihe ọjọọ laa nʼiyi nʼihu Chineke.
As smoke is driven off, so drive them away: as wax melteth before the fire, so let the wicked perish at the presence of God.
3 Ka ndị ezi omume bụrụ ndị nwere obi ụtọ, ma ṅụrịa nʼihu Chineke; ka ha bụrụ ndị nwere obi ụtọ, jupụtakwa nʼọṅụ.
But the righteous shall rejoice; they shall exult before God: yea, they shall be exceedingly joyful.
4 Bụkuo Chineke abụ, bụkuonụ aha ya abụ otuto, toonu onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya, Onyenwe anyị bụ aha ya, ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Sing unto God, sing praises to his name; extol him who rideth upon the heavens: the Everlasting is his name, and rejoice before him.
5 Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
A father of the fatherless, and a judge of the widows, is God in his holy habitation.
6 Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
God places those who are solitary in the midst of their families: he bringeth out those who are bound unto happiness; but the rebellious dwell in a dry land.
7 Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke, mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, (Sela)
O God, when thou didst go forth before thy people, when thou didst tread along through the wilderness—Selah—
8 elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
The earth quaked, also the heavens dropped at the presence of God, yea, this Sinai, at the presence of God, the God of Israel.
9 I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.
Rain of beneficence didst thou pour down, O God, whereby thou didst truly strengthen thy heritage, when it was weary.
10 Ndị gị biri nʼime ya, site nʼoke akụnụba gị, O Chineke, ị rọpụtaara ndị ogbenye mkpa ha.
Thy assembly dwelt therein: thou didst prepare it with thy goodness for the afflicted [people]. O God,
11 Onyenwe anyị kpọsara okwu ahụ, ọnụọgụgụ ndị inyom kwusara ya bụ igwe dị ọtụtụ;
The Lord gave [happy] tidings; they are published by the female messengers, a numerous host.
12 ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.
The kings of the armies flee away—flee away: yet she that tarried at home divideth the spoil.
13 Ọ bụladị mgbe ị na-arahụ ụra nʼetiti ọgba atụrụ, nku abụọ nke nduru m bụ ihe e ji ọlaọcha kpuchie, jirikwa ọlaedo nke na-enwuke kpuchie abụba ya.
When ye lie still between the folds [of your cattle], [ye will be like] the wings of the dove covered with sliver, and her pinions shining with flaming gold.
14 Mgbe Onye pụrụ ime ihe niile chụsasịrị ndị eze bi nʼala a, ọ dị ka snoo dara nʼelu Zalmon.
When the Almighty scattered kings in the midst of her, then even in darkness shone light [as pure] as snow.
15 Ugwu Bashan, ugwu mara mma nke ukwuu, ugwu Bashan, ugwu nwere nʼelu ya ọtụtụ ugwu dị iche iche.
A mountain of God is the mount of Bashan; many peaks hath the mount of Bashan.
16 Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
Why watch ye enviously, ye many-peaked mountains, yonder mountain which God hath chosen for his residence? yea, the Lord will also dwell [there] for ever.
17 Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
The chariots of God are two myriads; thousands of angels [follow him]: the Lord is among them: so is Sinai holy [among mountains].
18 Mgbe i rigoro gaa nʼelu, i duuru ndị a dọtara nʼagha; ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ, ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi, ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ.
Thou didst ascend on high, lead away captives, receive gifts among men, yea, even the rebellious, to dwell among them. O Lord God.
19 Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. (Sela)
Blessed be the Lord; day by day he loadeth us [with benefits]; our God is our salvation. (Selah)
20 Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
Our God is to us the God of salvation: and by the Eternal the Lord are the escapes from death.
21 Nʼezie, Chineke ga-egwepịa isi ndị iro ya niile, isi ndị niile na-aga nʼihu ibi ndụ mmehie.
But God will crush the head of his enemies, the hairy skull of him who walketh in his guiltiness.
22 Onyenwe anyị kwuru sị, “Aga m esite na Bashan kpọlata ha, aga m adọpụta ha site nʼebe omimi nke osimiri,
The Lord hath said, From Bashan will I bring back, I will bring back from the depths of the sea:
23 ka unu nwee ike saa ụkwụ unu nʼime ọbara ndị iro unu, ka ire nkịta unu niile ketakwa oke nke ha.”
In order that thou mayest wade with thy feet in blood, feeding the tongue of thy dogs from the enemies' blood.
24 O Chineke, ahụla igwe ahịrị mmadụ ndị na-eso gị, bụ igwe ahịrị mmadụ nke so Chineke m, na Eze m na-aba nʼebe nsọ ahụ.
Men see thy goings forth, O God! the goings forth of my God, my King, into the sanctuary.
25 Ndị na-abụ abụ nọ nʼihu, ndị na-eti egwu, na-eso ha nʼazụ; ụmụ agbọghọ na-akpọ ụbọ sokwa ha.
First come singers, then follow players on instruments, in the midst of maidens playing on timbrels.
26 Too Chineke nʼetiti nzukọ ukwuu ahụ; toonu Onyenwe anyị nʼetiti nzukọ ụmụ Izrel.
In assemblies bless ye God, [praise] the Lord, ye sprung from Israel's fountain.
27 Lee Benjamin bụ agbụrụ dịkarịsịrị nta, ka ọ na-edu ha, lekwaa igwe ụmụ ndị eze Juda na nke Zebụlọn na Naftalị.
There Benjamin the youngest leadeth them on, the princes of Judah in purple robes, the princes of Zebulun, the princes of Naphtali.
28 O Chineke, kpọlite ike gị; mee ka ike gị pụta ìhè, O Chineke, dịka i mere na mbụ.
Thy God hath ordained the rule to thee: strengthen, O God, what thou hast wrought for us.
29 Nʼihi ụlọnsọ ukwu gị nke dị na Jerusalem, ndị eze ga-ewetara gị onyinye dị iche iche.
Because of thy temple over Jerusalem shall kings bring presents unto thee.
30 Baara anụ ọhịa ahụ zoro nʼetiti riidi mba, igwe oke ehi nọ nʼetiti ụmụ ehi nke mba niile. Site na nweda nʼala, ka o wetara gị ogbe ọlaọcha. Chụsasịa mba niile, bụ ndị na-enwe mmasị nʼibu agha.
Rebuke the wild beasts hiding among the reeds, the troops of steers among the calves of nations, that hasten along with presents of silver. He scattereth nations that are eager for the fight.
31 Ndị nnọchi anya obodo, ga-esite nʼIjipt bịa, Kush ga-etinye onwe ya nʼokpuru Chineke.
Nobles will come out of Egypt: Ethiopia will stretch forth eagerly her hands unto God.
32 Bụkuo Chineke abụ, unu alaeze niile nke ụwa, bụkuo Onyenwe anyị abụ otuto, (Sela)
Kingdoms of the earth, sing unto God; sing praises unto the Lord: (Selah)
33 Bụọ abụ nye onye na-agba ịnyịnya nʼeluigwe, e, ọ bụladị eluigwe nke dịrị site na mgbe ochie, onye olu ike ya dịka egbe eluigwe.
To him who rideth over the highest heavens, of ancient days: hear! he sendeth forth his voice, the voice of might.
34 Kwusaa ike Chineke, onye ịdị ukwuu nke ịma mma ya na-ekpuchi Izrel, onye ike ya dị nʼeluigwe.
Ascribe ye strength unto God: his excellency is over Israel, and his strength is in the skies.
35 O Chineke, ị dị oke egwu nʼime ụlọnsọ gị; Chineke nke Izrel na-enye ndị ya ume na ike. Toonu Chineke!
Thou art tremendous, O God, from thy holy residences: O God of Israel, [thou art] he that givest strength and power unto [thy] people. Blessed be God.