< Abụ Ọma 67 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, (Sela)
Nkunga kuidi pfumu minyimbidi, kayimbidila mu ngitala. Bika Nzambi katusila nlemvo ayi katusakumuna; ayi zizi kiandi kitukienzula;
2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
muingi zinzila ziaku zizabakana va ntoto, phulusu aku yizabakana muidi makanda moso!
3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
Bika batu bazitisa, a Nzambi; bika batu boso bazitisa.
4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. (Sela)
Bika makanda mayangalala ayi mayimbila mu diambu di khini bila ngeyo weti yadila batu mu busonga; ngeyo wela diatisa makanda ma ntoto.
5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
Bika batu bazitisa, a Nzambi; bika batu boso bazitisa.
6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
Buna ntoto wuela buta mimbutu miandi; Nzambi, Nzambi eto, wela kutusakumuna.
7 Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Nzambi wela kutusakumuna ayi zitsuka zioso zi ntoto ziela kunkinzika.

< Abụ Ọma 67 >