< Abụ Ọma 67 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, (Sela)
一篇詩歌,交與伶長。用絲弦的樂器。 願上帝憐憫我們,賜福與我們, 用臉光照我們, (細拉)
2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.
好叫世界得知你的道路, 萬國得知你的救恩。
3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
上帝啊,願列邦稱讚你! 願萬民都稱讚你!
4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. (Sela)
願萬國都快樂歡呼; 因為你必按公正審判萬民, 引導世上的萬國。 (細拉)
5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; ka mmadụ niile too gị.
上帝啊,願列邦稱讚你! 願萬民都稱讚你!
6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
地已經出了土產; 上帝-就是我們的上帝要賜福與我們。
7 Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
上帝要賜福與我們; 地的四極都要敬畏他!

< Abụ Ọma 67 >