< Abụ Ọma 66 >

1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
Fún adarí orin. Orin. Saamu. Ẹ hó ìhó ayọ̀ sí Ọlọ́run, ẹ̀yin ilẹ̀ gbogbo!
2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
Ẹ kọrin ọlá orúkọ rẹ̀; ẹ kọrin ìyìnsí i.
3 Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
Ẹ wí fún Ọlọ́run pé, “Ìwọ ti ní ẹ̀rù tó nínú iṣẹ́ rẹ! Nípa ọ̀pọ̀ agbára rẹ ni àwọn ọ̀tá rẹ yóò fi sìn ọ́.
4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” (Sela)
Gbogbo ayé ń wólẹ̀ fún ọ; wọn ń kọrin ìyìn sí ọ, wọ́n ń kọrin ìyìn sí orúkọ rẹ.” (Sela)
5 Bịa lee ihe Chineke mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!
Ẹ wá wo ohun tí Ọlọ́run ṣe, iṣẹ́ rẹ̀ ti ní ẹ̀rù tó sí àwọn ọmọ ènìyàn!
6 O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.
Ó yí òkun padà sí ilẹ̀ gbígbẹ, wọ́n fi ẹsẹ̀ rin inú omi kọjá, níbẹ̀ ni àwa yọ̀ nínú rẹ̀.
7 Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. (Sela)
Ó ń jẹ ọba títí láé nípa agbára rẹ̀, ojú rẹ̀ ń wo orílẹ̀-èdè kí àwọn ọlọ̀tẹ̀ má ṣe gbé ara wọn ga. (Sela)
8 Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya;
Ẹ yin Ọlọ́run wa, ẹ̀yin ènìyàn, jẹ́ kí a mú ni gbọ́ ohùn ìyìn rẹ̀;
9 O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.
Ó ti dá ààbò bo ẹ̀mí wa, kò sì jẹ́ kí ẹsẹ̀ wa kí ó yẹ̀.
10 Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.
Nítorí ìwọ, Ọlọ́run, dán wa wò; ìwọ dán wa bí a tí ń dán fàdákà wò.
11 Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.
Ìwọ mú wa wá sínú ẹ̀wọ̀n o sì di ẹrù lé ẹ̀yìn wa.
12 I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.
Ìwọ mú àwọn ènìyàn gún wá ní orí àwa la iná àti omi kọjá ṣùgbọ́n ìwọ mú wa dé ibi ọ̀pọ̀.
13 Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị
Èmi ó wá sí tẹmpili rẹ pẹ̀lú ọrẹ ẹbọ sísun, kí n sì mú ẹ̀jẹ́ mi ṣẹ sí ọ,
14 nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.
ẹ̀jẹ́ tí ètè mi jẹ́, tí ẹnu mi sì sọ nígbà tí mo wà nínú ìṣòro.
15 Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. (Sela)
Èmi ó rú ẹbọ sísun ọlọ́ràá sí ọ, àti ẹbọ ọ̀rá àgbò; èmi ó rú akọ màlúù àti ewúrẹ́. (Sela)
16 Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; ka m kọọrọ unu ihe o meere m.
Ẹ wá gbọ́ gbogbo ẹ̀yin tí ó bẹ̀rù Ọlọ́run; ẹ jẹ́ kí n sọ ohun tí ó ṣe fún mi.
17 Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire.
Mo fi ẹnu mi kígbe sókè sí i, ìyìn rẹ̀ wà ní ẹnu mi.
18 Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;
Bí èmi bá gba ẹ̀ṣẹ̀ ní àyà mi, Olúwa kì yóò gbọ́ ohùn mi;
19 ma Chineke gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m.
ṣùgbọ́n Ọlọ́run gbọ́ nítòótọ́ ó ti gbọ́ ohùn mi nínú àdúrà.
20 Otuto dịrị Chineke, onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
Ìyìn ni fún Ọlọ́run ẹni tí kò kọ àdúrà mi tàbí mú ìfẹ́ rẹ̀ kúrò lọ́dọ̀ mi!

< Abụ Ọma 66 >