< Abụ Ọma 65 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
Dem Musikmeister. Ein Psalm Davids. Ein Lied. Dir gebührt Lobpreis, o Gott, auf Zion, und dir bezahle man Gelübde!
2 O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,
Der du Gebete hörst, zu dir kommt alles Fleisch.
3 Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
Meine Verschuldungen hatten mich überwältigt, aber du deckst unsere Vergehungen zu.
4 Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.
Wohl dem, den du erwählst und nahen lässest, daß er in deinen Vorhöfen wohne, damit wir uns ersättigen an den Gütern deines Hauses, deines heiligen Tempels.
5 O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
Mit furchtbaren Thaten antwortest du uns nach deiner Gerechtigkeit, du Gott, der du unser Heil bist, du Zuversicht aller der fernen Enden der Erde und des Meers,
6 onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
der durch seine Kraft die Berge feststellt, mit Stärke gegürtet ist,
7 onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
der das Brausen des Meeres stillt, das Brausen seiner Wellen und das Toben der Völker,
8 Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
so daß sich die Bewohner der äußersten Enden vor deinem Zeichen fürchten: die Länder gegen Morgen und gegen Abend versetzest du in Jubel.
9 Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. Isi iyi Chineke adịghị ata ata, nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
Du hast das Land heimgesucht und hast es getränkt, hast es gar reich gemacht mit einem Gottesbache voll Wasser, bereitest Getreide für sie, denn also bereitest du das Land.
10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
Du tränkst seine Furchen, lockerst seine Schollen, weichst es durch Regenschauer auf, segnest sein Gewächs.
11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
Du kröntest das Jahr mit deiner Güte, und deine Geleise triefen von Fett.
12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
Es triefen die Auen der Steppe, und mit Jubel gürten sich die Hügel.
13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.
Die Anger sind mit Herden von Schafen bekleidet, und die Thalgründe hüllen sich in Korn: sie jauchzen einander zu und singen.

< Abụ Ọma 65 >