< Abụ Ọma 65 >
1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị,
Kwa mtsogoleri wa mayimbidwe. Salimo la Davide. Nyimbo. Matamando akudikira Inu Mulungu mu Ziyoni; kwa inu malumbiro athu adzakwaniritsidwa.
2 O gị onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,
Inu amene mumamva pemphero, kwa inu anthu onse adzafika.
3 Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, ị gbaghara anyị njehie anyị niile.
Pamene tinathedwa nzeru ndi machimo, Inu munakhululukira mphulupulu zathu.
4 Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, mee ka afọ ju anyị.
Odala iwo amene inu muwasankha ndi kuwabweretsa pafupi kukhala mʼmabwalo anu! Ife tadzazidwa ndi zinthu zabwino za mʼNyumba mwanu, za mʼNyumba yanu yoyera.
5 O Chineke, Onye nzọpụta anyị, i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, na osimiri niile dị ebe dị anya,
Mumatiyankha ife ndi ntchito zodabwitsa zachilungamo, Inu Mulungu Mpulumutsi wathu, chiyembekezo cha mathero onse a dziko lapansi ndi cha nyanja zomwe zili kutali kwambiri,
6 onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha,
amene munapanga mapiri ndi mphamvu zanu, mutadziveka nokha ndi mphamvu.
7 onye mere ka ụda olu oke osimiri niile na ụda olu ebili mmiri, na ọgbaaghara mba niile deere duu.
Amene munakhalitsa bata nyanja kukokoma kwa mafunde ake, ndi phokoso la anthu a mitundu ina.
8 Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ.
Iwo amene akukhala kutali amaopa zizindikiro zozizwitsa zanu; kumene dzuwa limatulukira ndi kumene dzuwa limalowera. Inu mumafuna nyimbo zachimwemwe.
9 Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. Isi iyi Chineke adịghị ata ata, nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị.
Inu mumasamalira dziko lapansi ndi kulithirira; Inuyo mumalilemeretsa kwambiri. Mtsinje wa Mulungu ndi wodzaza ndi madzi kuti upereke tirigu kwa anthu, pakuti Inu munakhazikitsa zimenezi.
10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya.
Mwadzaza nthaka yake ndi madzi ndi kusalaza migula yake, mwayifewetsa ndi mvula yamawawa ndi kudalitsa mbewu zake.
11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke.
Inu mumaveka chaka ndi zinthu zochuluka, ndipo ngolo zanu zimasefukira ndi zinthu zochuluka.
12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe.
Malo a udzu a mʼchipululu amasefukira; mapiri avekedwa ndi chisangalalo.
13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.
Madambo akutidwa ndi zoweta ndi zigwa zavekedwa ndi tirigu; izo pamodzi zikufuwula ndi kuyimba mwachimwemwe.