< Abụ Ọma 64 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Nụrụ olu m O Chineke, mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m.
For the leader. A psalm of David. Hear, O my God, the voice of my lament: guard my life from the dread of the foe.
2 Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe.
Hide me from villains who secretly plot, from the blustering throng of the workers of evil,
3 Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ.
who have sharpened their tongue like a sword, and aimed bitter words like arrows,
4 Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu.
which from ambush they launch at the blameless, shooting swiftly and unafraid.
5 Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?”
They strengthen their wicked purpose, they tell of the snares they have hidden, they say to themselves, “Who can see?”
6 Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ.
They think out their crimes full cunningly hidden deep in their crafty hearts.
7 Ma Chineke ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha.
But God with his arrow will shoot them, swiftly shall they be smitten.
8 Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo.
For their tongue he will bring them to ruin, all will shudder with horror at the sight of them.
9 Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke Chineke, ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere.
Then every person, touched to awe, as they ponder what God has wrought, will tell the tale of his deeds.
10 Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.
In the Lord shall the righteous rejoice, in him shall they take refuge; and all the true-hearted shall glory.

< Abụ Ọma 64 >