< Abụ Ọma 63 >

1 Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. 3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. 7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. 8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m. 9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa. 10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa. 11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.

< Abụ Ọma 63 >