< Abụ Ọma 63 >

1 Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
Zabura ta Dawuda. Sa’ad da yake a hamadar Yahuda. Ya Allah, kai ne Allahna, da nacewa na neme ka; raina yana ƙishinka, jikina yana marmarinka, cikin busasshiyar ƙasar da ta zozaye inda babu ruwa.
2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.
Na gan ka a wuri mai tsarki na kuma dubi ikonka da ɗaukakarka.
3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Domin ƙaunarka ta fi rai kyau, leɓunana za su ɗaukaka ka.
4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
Zan yabe ka muddin raina, kuma a cikin sunanka zai ɗaga hannuwana.
5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
Raina zai ƙoshi kamar da abinci mafi kyau; da leɓunan rerawa bakina zai yabe ka.
6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
A gadona na tuna da kai; ina tunaninka dukan dare.
7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
Domin kai ne mai taimakona, ina rera a cikin inuwar fikafikanka.
8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.
Raina ya manne maka; hannunka na dama yana riƙe da ni.
9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.
Su da suke neman raina za su hallaka; za su gangara zuwa zurfafan duniya.
10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
Za a bayar da su ga takobi su kuma zama abincin karnukan jeji.
11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
Amma sarki zai yi farin ciki ga Allah; dukan waɗanda suke rantse da sunan Allah za su yabe shi, amma za a rufe bakunan maƙaryata.

< Abụ Ọma 63 >