< Abụ Ọma 63 >

1 Abụ Ọma Devid, mgbe ọ nọ nʼọzara Juda. O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya.
O God, you are my God; early will I seek you: my soul thirsts for you, my flesh longs for you in a dry and thirsty land, where no water is;
2 Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị.
To see your power and your glory, so as I have seen you in the sanctuary.
3 Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma.
Because your loving kindness is better than life, my lips shall praise you.
4 Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị.
Thus will I bless you while I live: I will lift up my hands in your name.
5 Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị.
My soul shall be satisfied as with marrow and fatness; and my mouth shall praise you with joyful lips:
6 Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile.
When I remember you on my bed, and meditate on you in the night watches.
7 Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị.
Because you have been my help, therefore in the shadow of your wings will I rejoice.
8 Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.
My soul follows hard after you: your right hand upholds me.
9 A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.
But those that seek my soul, to destroy it, shall go into the lower parts of the earth.
10 A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa.
They shall fall by the sword: they shall be a portion for foxes.
11 Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke; ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
But the king shall rejoice in God; every one that swears by him shall glory: but the mouth of them that speak lies shall be stopped.

< Abụ Ọma 63 >