< Abụ Ọma 62 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.
Ki te tino kaiwhakatangi, ki a Ierutonu. He himene na Rawiri. Ko te Atua anake taku e tatari nei: kei a ia te whakaoranga moku.
2 Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
Ko ia anake toku kohatu, toku whakaoranga, toku pa hoki, e kore e nui toku ngaueuetanga.
3 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?
Kia pehea te roa o ta koutou tatau ki te tangata, kia whakamatea ai e koutou, e koutou katoa, ka rite ki te taiepa e tungou ana, ki te wawa ka tata te hinga?
4 Ha ekpebiela isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. (Sela)
Heoi ano ta ratou e runanga ai ko te turaki i a ia i tona wahi teitei: e ahuareka ana ki te teka; e manaaki ana o ratou mangai, a e kanga ana a roto i a ratou. (Hera)
5 O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; olileanya m na-esite na ya na-abịa.
Tatari, e toku wairua, ki te Atua anaki; ko ia taku e tumanako nei.
6 Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
Ko ia anake toku kohatu, toku whakaoranga, toku pa hoki; e kore ahau e whakangaueuetia.
7 Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke, Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
Kei te Atua te whakaoranga moku, te kororia ano moku; kei te Atua te kohatu o toku kaha, toku piringa.
8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. (Sela)
Whakawhirinaki ki a ia i nga wa katoa, e te iwi, ringihia to koutou ngakau ki tona aroaro: hei piringa mo tatou te Atua (Hera)
9 Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, ndị ukwu bụ naanị ụgha; ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; ha niile bụ naanị otu nkuume.
He pono he mea memeha noa nga ware, he teka noa nga rangatira; ki te paunatia ratou, mama noa ake ratou tahi i te horihori.
10 Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; akụ unu nwere ike mụbaa, unu atụkwasịla ha obi.
Kaua e whakawhirinaki ki te tukino, kei wairangi hoki ki te pahua: ki te tini haere nga taonga, kei whakamanawa to koutou ngakau ki reira.
11 Chineke ekwuola otu ihe, ihe abụọ ka m nụrụ: “Na gị, O Chineke, dị ike,
Kotahi korerotanga a te Atua, ka rua oku rongonga i tenei, no te Atua te kaha.
12 na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”
Nau ano, e te Ariki, te mahi tohu: rite tonu hoki ki tana mahi tau utu ki te tangata.