< Abụ Ọma 61 >
1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ. Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m.
Kwa mwimbishaji. Kwa ala za nyuzi za uimbaji. Zaburi ya Daudi. Ee Mungu, sikia kilio changu, usikilize maombi yangu.
2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
Kutoka miisho ya dunia ninakuita, ninaita huku moyo wangu unadhoofika; uniongoze kwenye mwamba ule ulio juu kuliko mimi.
3 Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.
Kwa kuwa umekuwa kimbilio langu, ngome imara dhidi ya adui.
4 Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. (Sela)
Natamani kukaa hemani mwako milele, na kukimbilia chini ya uvuli wa mbawa zako.
5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
Ee Mungu, kwa kuwa umesikia nadhiri zangu, umenipa urithi wa wale wanaoliogopa jina lako.
6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
Mwongezee mfalme siku za maisha yake, miaka yake kwa vizazi vingi.
7 Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
Yeye na atawazwe kwenye kiti cha enzi mbele za Mungu milele; amuru upendo wako na uaminifu wako vimlinde.
8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
Ndipo daima nitaliimbia sifa jina lako na kuzitimiza nadhiri zangu siku baada ya siku.