< Abụ Ọma 61 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ. Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m.
(다윗의 시. 영장으로 현악에 맞춘 노래) 하나님이여, 나의 부르짖음을 들으시며 내 기도에 유의하소서
2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
내 마음이 눌릴 때에 땅 끝에서부터 주께 부르짖으오리니 나보다 높은 바위에 나를 인도하소서
3 Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.
주는 나의 피난처시요 원수를 피하는 견고한 망대심이니이다
4 Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. (Sela)
내가 영원히 주의 장막에 거하며 내가 주의 날개 밑에 피하리이다 (셀라)
5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.
하나님이여, 내 서원을 들으시고 주의 이름을 경외하는 자의 얻을 기업을 내게 주셨나이다
6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.
주께서 왕으로 장수케 하사 그 나이 여러 대에 미치게 하시리이다
7 Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.
저가 영원히 하나님 앞에 거하리니 인자와 진리를 예비하사 저를 보호하소서
8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.
그리하시면 내가 주의 이름을 영원히 찬양하며 매일 나의 서원을 이행하리이다

< Abụ Ọma 61 >