< Abụ Ọma 60 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Da muryar “Lilin Alkawari.” Wani miktam ta Dawuda. Don koyarwa. Sa’ad da ya yaƙi Aram-Naharayim da Aram-Zoba, da kuma sa’ad da Yowab ya dawo ya bugi mutanen Edom dubu goma sha biyu a Kwarin Gishiri. Ka ki mu, ya Allah, ka kuma fashe kāriyarmu; ka yi fushi da mu, yanzu ka mai da mu!
2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
Ka girgiza ƙasar ka kuma tsaga ta; ka daure karayarta, gama tana rawa.
3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
Ka nuna wa mutanenka lokutan wahala; ka ba mu ruwan inabin da ya sa muka bugu.
4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. (Sela)
Amma ga waɗanda suke tsoronka, ka ɗaga tuta don a buɗe gāba da baka. (Sela)
5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
Ka cece mu ka kuma taimake mu da hannunka na dama, domin waɗanda kake ƙauna su kuɓuta.
6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
Allah ya yi magana daga wurinsa mai tsarki, “Da nasara zan rarraba Shekem in kuma auna Kwarin Sukkot.
7 Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
Gileyad nawa ne, Manasse kuma nawa ne; Efraim shi ne hular kwanona, Yahuda kuma sandar mulkina.
8 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
Mowab shi ne kwanon wankina, a kan Edom zan jefa takalmina; a bisa Filistiya zan yi kirarin nasara.”
9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
Wa zai kawo ni birnin katanga? Wa zai bishe ni zuwa Edom?
10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
Ba kai ba ne, ya Allah, kai da ka ƙi mu ba ka kuwa fita tare da mayaƙanmu?
11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
Ka ba mu gudummawa a kan abokin gāba, gama taimakon mutum banza ne.
12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
Tare da Allah za mu yi nasara, zai kuma tattake abokan gābanmu.

< Abụ Ọma 60 >