< Abụ Ọma 60 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị.
To the Overseer. — 'Concerning the Lily of Testimony,' a secret treasure of David, to teach, in his striving with Aram-Naharaim, and with Aram-Zobah, and Joab turneth back and smiteth Edom in the valley of Salt — twelve thousand. O God, Thou hadst cast us off, Thou hadst broken us — hadst been angry! — Thou dost turn back to us.
2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji.
Thou hast caused the land to tremble, Thou hast broken it, Heal its breaches, for it hath moved.
3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị.
Thou hast shewn Thy people a hard thing, Thou hast caused us to drink wine of trembling.
4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. (Sela)
Thou hast given to those fearing thee an ensign. To be lifted up as an ensign Because of truth. (Selah)
5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya.
That Thy beloved ones may be drawn out, Save [with] Thy right hand, and answer us.
6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, “Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem, tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya.
God hath spoken in His holiness: I exult — I apportion Shechem, And the valley of Succoth I measure,
7 Gilead bụ nke m, otu a kwa, Manase bụkwa nke m; Ifrem bụ okpu igwe m, Juda bụ mkpara eze m.
Mine [is] Gilead, and mine [is] Manasseh, And Ephraim [is] the strength of my head, Judah [is] my lawgiver,
8 Moab bụ efere ịkwọ aka m, aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.”
Moab [is] my pot for washing, over Edom I cast my shoe, Shout, concerning me, O Philistia.
9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? Onye ga-edu m gaa Edọm?
Who doth bring me [to] a city of bulwarks? Who hath led me unto Edom?
10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha?
Is it not Thou, O God? hast Thou cast us off? And dost Thou not go forth, O God, with our hosts!
11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu.
Give to us help from adversity, And vain [is] the deliverance of man.
12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala.
In God we do mightily, And He treadeth down our adversaries!

< Abụ Ọma 60 >